Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Udo Funahụrụ EfunahụIhe Atụ

Missing Peace

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Udo Nke Mmekọrịta

Ejighi n'aka na-ebuli esemokwu na echiche nke ekweghị ihe onye ọbụla kwuru. Na n'oge ebe "enwetụbeghị ụdị ya" nwere ike ịbụ okwu nke afọ, anyị niile echewo ụfọdụ esemokwu ihu.

Ma ọ bụ arụmụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-amalite ka a na eri nri n'oge ezumike, okwu nke ekwuru gbasara mgbasa ozi na-abanye n'esemokwu, ma ọ bụ inwe mkparịta ụka siri ike banyere ókè etu anyị chọrọ ka esi mee anyị ihe ma ọ bụ kpaso anyị agwa, mgbe ụfọdụ ndị anyị hụrụ n'anya na-abụkwa ndị n'enye anyị nsogbu kachasị.

Ma udo ga-ekwe onwunwe na mmekọrịta anyị. N’eziokwu, iweta udo n’ụwa bụ ihe a kpọrọ anyị ka anyị mee dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs kwuru sị:

Ngọzi na-adịrị ndị na-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. Matiu 5:9 NIV

Rịba ama na ọ kwuru "onye na-eme udo" ọ bụghị "onye na-edebe udo." Ime udo bụ ihe a na-anogide n'ọrụ ya oge niile. Ọ pụtaghị na anyị na-agbaso echiche ọ bụla a na-atụputa na oge anyi na-eri nri abalị. Ọ pụtaghịkwa na anyị ga-ekwenye na ihe niile ma ọ bụ ghara ịkpata esemokwu. Omume ndị ahụ nwere ike ime ka ọ dị ka a na-eme udo—ma ọ bụghị ezi udo.

Ọ bụ ezie na ọ na-amasị ike ileghara esemokwu anya ma ọ bụ ime ka ọ dighị ebe ahụ, nke ahụ abụghị nzaghachi dị ịhụnanya. Ndị Rom 12:9 na-echetara anyị na ịhụnanya ga-abụriri ezi ya. Ọ bụrụ n'anyị na-ekpuchi mmetụta otu e siri mejọọ anyị, anyị anaghị eweta udo—anyị na-agbanari usoro nke ịme udo.

Otú ọ dị, Pọl nọgidere na-ama anyị aka ná Ndị Rom 12 ka anyị tụlee otú udo dị n’ezie, ọ dịghịkwa mfe. Mgbe ọ gbasịrị anyị ume ka anyị gọzie ndị na-emejọ anyị, ka anyị zere ịbọ ọbọ, na ka anyị na ndị ọzọ bie ndụ n’ụzọ nkwekọ, ọ nyere ihe ịma aka a:

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ka ọ dabere na gị, gị na mmadụ niile na-ebi n’udo. Ndị Rom 12:18 NIV

Rịba ama na ọ na-ekwu, "ka ọ dabere na gị.” Nke ahụ pụtara na anyị anaghị enweta ikike ime ihe ọbụla anyị chọrọ n'ihi àgwà nwanne nna anyị nwere àgwà ọjọọ. N'agbanyeghị otú ihe niile si agba aghara gburugburu anyị, Chineke ka chọrọ ka anyị na-achụso udo, ma nke ahụ opụtara ịgakwuru onye ahu kwuoro ya okwu ma ọ bụ iwepụ onwe anyị n'ọnọdụ ahu ma ọ bụrụ na anyị maara na ọ bụ ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi weta udo n'oge ahụ.

Ya mere, kedu ka ị ga-esi bụrụ onye na-eme udo n'ọnọdụ niile? Anyị na-enwetakwu amamihe gbasara nke a site n'aka Jemes:

Mana amamihe nke si n'elu-igwe bia buuru uzọ di ọcha; ma dị ihụ udo n'anya, dị ncheba echiche, dị idobe onwe n'okpuru, jupụta na ebere na ezi mkpụrụ, dị adịghị ele mmadụ anya n’ihu na dị ezi. Ndị na-eme udo na-agha mkpụrụ n’udo na-ewe ihe ubi nke ezi omume. Jemes 3:17-18 NIV

Ịbụ onye na-eme udo dị ka ịrịọ Chineke maka amamihe, wee nwalee amamihe ahụ site n'ịtụle ma ọ jupụtara na udo ma ọ jupụtara na mpako nke onwe anyị. Ọ pụtara na n'agbanyeghị na ọ dị mma ka anyị kerịta echiche anyị na kwupụta nchegbu anyị, anyị na-ebuli ndị ọzọ na ihe gbasara ha elu karịa onwe anyị.

Ọ dị ka ịdị umeala n'obi na ime amara mgbe anyị na-ekerịta echiche anyị. Ọ pụtara ịtụle ebumnobi anyị maka nkekọrịta na ijide n'aka na anyị ji mweghachi n'uche mee ya. Ọ dịkwa ka ịjụ ma ebumnobi anyị ọ̀ bụ ịchọ ezi omume ka ọ̀ bụ ka ọ buru na anyị bụ ndị eziokwu.

Ya mere, mgbe ịchọtara onwe gị n'ọnọdụ chọrọ ụfọdụ udo nke mmekọrịta, kwụsịtụ. Were onye nke ọzọ dika okwu ya na ihe ya ọ kacha nma. Kwuo banyere mmetụta ị na-enwe ma ọ bụ ihe ị na-eche. Dị umeala n'obi. Gosipụta ọmịiko. Kpee ekpere banyere ya. Ma jụọ onwe gị ihe ọzọ ị ga-eme iji weta udo n'ọnọdụ ahụ.

Mgbe ị na-eme otú ahụ, ị na-abụ onye na-eme udo—na ị na-abụ nwa Chineke.

Igodo: ụbọchị_abụọ ụbọchị_abụọ
Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Missing Peace

Ọ̀ ga-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtara na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasiri anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwere ajụjụ. N...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara