Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Udo Funahụrụ EfunahụIhe Atụ

Missing Peace

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Udo Nke Uche

Chee echiche azụ n'oge ndụ gị mgbe ị gbara nnukwu mgba. Ma eleghị anya ị lụsoro nchegbu ma ọ bụ ịda mbà n'obi ọgụ. Ma eleghị anya onye ị hụrụ n'anya nwụnahụrụ gị. Ma eleghị anya ị na-eche banyere mfu nke ebumnobi gị, ma ọ bụ ọnwụ nke ihe ị chere na ndụ gị ga-adị ka. Kedu ihe ụfọdụ kacha enye aka ndị mmadụ meere gị?

Ị nwere ike ị gaghị echeta okwu mmadụ kwuuru gị. Ma ị na-echeta onye nọ n'akụkụ gị mgbe ị na-agabiga ihe isi ike nke ndụ gị. Ị na-echeta ndị gere gị ntị, ndị pụtara mgbe ị kporo ha, na ndị wepụtara oge iji nọnyere gị.

Mgbe anyị na-eche mgba anyị siri ike ihu, anyị nwere ike zuru ike n’eziokwu na Chineke mgbe niile na-anọnyere anyị. N’ezie, n’akwụkwọ Aịzaya, a kpọrọ Jizọs Immanuel, nke pụtara “Chineke nọnyeere anyị.”

Mgbe anyị na-agbasi mbọ ike ịhụ udo n’etiti ọnọdụ anyị, mgbe ụfọdụ ihe kacha mma anyị nwere ike ime bụ ikweta na Chineke nọnyeere anyị ma kelee Ya maka onyinye nke ọnụnọ Ya.

Ma ozi ọma bụ na anyị agaghị eme nke a n’ike nke aka anyị. Mgbe anyị na-eso Jizọs, Ọ na-enye anyị onyinye ọzọ—ọnụnọ nke Mmụọ Nsọ. Anyị agaghị naanị eji ike eme ihe ndụ ma ọ bụ kpalite obi ike anyị na udo n'onwe anyị. Kama, anyị nwere ike ịrịọ Mmụọ Nsọ ka Ọ duzie ndụ anyị, chekwaa obi anyị, na mịpụta mkpụrụ nke karịrị oke iwe anyị maka ihe adịghị agara anyị nke ọma.

Dị ka Pọl na-echetara anyị:

Ndị mmụọ ọjọọ na-achị na-eche echiche banyere ihe mmehie, mana ndị Mmụọ Nsọ na-achị na-eche echiche banyere ihe na-amasị Mmụọ Nsọ. Ya mere, ikwe ka ọdịdị mmehie gị na-achịkwa uche gị na-eduba n'ọnwụ. Ma ịkwe ka Mmụọ Nsọ na-achịkwa uche gị na-eduba ná ndụ na udo. Ndị Rom 8:5-6 NLT

Mgbe echiche anyị na-enye anyị nsogbu gbasara nte akụkọ, esemokwu maka mgbasa ozi, na ihe niile na-eri anyị nri n'ahu, ọ bụ ihe n'enweghị mgbagha na ụjọ ga-atụ anyị na ya dị anyị ka awụkpụrụ anyị n'ime ọnọdụ ndị a niile. Ma n’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị amamihe ka a na-agwa anyị ihe ndị na-eme, anyị kwesịrị ijupụta uche anyị n'ezie jiri ihe ndị na akwaji mmụọ anyị ka ọ nwuru ọkụ.

N'ezie, otu ụzọ isi nweta udo nke Chineke bụ site n'icheta nkwa Chineke na ilekwasị anya na nkwa ndị ahụ karịa na nsogbu gị.

Ị Na-eche otu ị ga-esi amalite? Gụọ Abụ Ọma nke 23 ugboro ugboro, na-echetara onwe gị na Chineke nọnyere gị mgbe ọnwụnwa chere gị ihu, mgbe ị na-agafe na ndagwurugwu, ma ọ bụ mgbe ị na-achọ nkasi obi. Depụta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Chineke. Dị ka ihe atụ: Ọ nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso. Ọ na-enye udo nke karịrị nghọta. Ọ bụ ebe mgbaba n'oge nsogbu. Ọ bụ Onye-Ndụmọdụ anyị Dị Ebube, Chineke anyị Dị Ike, Onyeisi Udo anyị!

Taa, ọ bụrụ na ị na-enwe nchegbu ma ọ bụ na-enwe mmetụta nke karịrị gị, mara nke a: Chineke na-eche banyere gị. Ọ na-ahụ gị. Ọ hụrụ gị n'anya. Ọ nọnyeere gị. Ọ nọ maka gị. Ị nwere ike ịchụso udo site n'ikwukwasị nkwa Chineke na nsogbu gị na inyefe echiche gị n'aka Mmụọ Nsọ.

Igodo: ụbọchị_ato ụbọchị_ato
Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Missing Peace

Ọ̀ ga-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtara na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasiri anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwere ajụjụ. N...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara