Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Udo Funahụrụ EfunahụIhe Atụ

Missing Peace

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Udo Na Chineke

Anyị ekwuwo banyere icheta nkwa Chineke na àgwà Chineke, mana kedukwanụ mgbe ọ dị gị ka gị na Chineke adịghị n’udo? Ma eleghị anya, iwe na-ewesi gị ike n'ebe Chineke nọ n'ihi na ọ dị gị ka Ọ meghị ihe ị lere Ya anya ka Ọ meere gị n'oge na-adịbeghị anya. Ma ọ bụ ikekwe ị na-enwe mmechu ihu n'ihi na ị pụghị ikweta na Chineke dị ihụ n'anya ga-ekwe ka ihe isi ike dị otú ahụ mee n'ụwa.

Nke a bụ ihe ị kwesịrị ịma: Chineke nwere ike ịdịnwụ iwe ike nke mmetụta gị.

Ọ kaara Chineke mma na ị kwupụtara nchegbu gị n’ebe Ọ nọ karịa isi n’ebe Ọ nọ pụọ. N’ikwu eziokwu, Chineke ji obi Ya niile na-achụ gị nke mere na Ọ zitere Ọkpara nke Ya n’ụwa ka Ọ wetara gị ụzọ udo.

Ewezuga Jizọs, e kewapụrụ anyị na Chineke n’ihi mmehie anyị. Ma Chineke, ebe ọ bụ Nna na-ahụ n'anya, chọrọ ka anyị na Ya dị ná mma. Ya mere Ọ jiri mee ụzọ:

Ma a dụpụrụ Ya ahụ n'ihi njehie-anyi, a gwọpiara Ya n'ihi ajọ omume niile anyi; ntarama-ahụhụ nke wetara anyị udo dị n’isi Ya, sitekwa n’ọnya Ya ka a gwọworo anyị. Aịzaịya 53:5 NIV

Jizọs weghachiri udo ná mmekọrịta anyị na Chineke, nke pụtara na anyị nwere ohere zuru ezu na nke n'enweghị ugwo ọbụla site n’aka Jizọs ịgakwuru Nna anyị nke hụrụ anyị n’anya, na-agbaghara anyị, ma na-eche banyere anyị. Ọ nweghị ihe omere ma ị iwesara Ya iwe mgbe ihe na-agaghị otu ọ ga-esi masị gị—naanị ekwela ka ihe mgbu nke ọnọdụ gị kpuchie ịdị mma nke àgwà Ya.

Pastọ Amy Groeschel na-ekwu ya otú a: "Anyị ga-eji ihe anyị maara bụ eziokwu site n'okwukwe gwa ihe mgbu nke mmetụta anyị okwu.”

Mmetụta gị abụghị ihe asi, mana enyela ha mmeri n'isi gị. N’ezie, Abụ Ọma 46:10 jupụtara na ihe ncheta dị ike:

Ọ na-asị, “Dị jụụ, ma mara na Mụ onwe M bụ Chineke; A ga-ebuli M elu n’etiti mba dị iche iche, a ga-ebulikwa M elu n’ụwa.” Abụ Ọma 46:10 NIV

Ọ na-enye anyị ndụmọdụ ka anyị dị jụụ ma mara na Ọ bụ Chineke. Ọ naghi ekwu, “Dị jụụ ma nwee mmetụta” na Ọ bụ Chineke. Mmetụta anyị dị irè, ma ọ bụghị mgbe nile ka ha na-agbanye mkpọrọgwụ n'eziokwu. Otú ọ dị, Chineke, bụ isi nke okwukwe anyị, dị nguzosi ike mgbe nile ma bụrụ eziokwu, ya mere anyị nwere ike iji okwukwe anyị nyochaa mmetụta anyị.

Nke ahụ apụtaghị na anyị apụghị ịjụ Chineke ajụjụ. Abụ ọma jupụtara na ebe Devid na ndị ọzọ na-etiku Chineke, na-arịọ Ya ka Ọ gbanwee ọnọdụ, na-eche ma Chineke Ọ na-egekwa ntị. Mana ha na-alọghachi n’eziokwu mgbe nile—na Chineke dị mma. Ọ nwere ezi atụmatụ maka anyị. Ọ bụ Ya na-achị. Ọ tozuru inata ofufe anyị na nkwesị ntụkwasị obi anyị.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị nweghị udo n’ebe Chineke nọ taa, jiri ike nke Okwu Chineke gwa mmetụta gị ndị ahụ okwu. Chetakwa ozi ọma a: Jizọs bụ ụzọ anyị na Chineke iji dị n’udo. Ọ meere anyị ọrụ ahụ. Na Ọ kwụwori ụgwọ zuru ezu maka udo.

Igodo: ụbọchị_ise ụbọchị_ise
Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Missing Peace

Ọ̀ ga-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtara na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasiri anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwere ajụjụ. N...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara