Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Atụ

Praying With Wonder Through Christmas

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

Ka anyị kpee ekpere:

Nna anyị nke bi n’elu-igwe, anyị chetara na n’otu oge anyị bụ ndị e kewapụrụ na Kraịst, bụrụ ndị e kewapụrụ n’etiti ndị Gị na bụrụ ndị n'enweghị okè ọbụla n’ime ọgbụgba ndụ Gị, bụrụ ndị n’enweghị olileanya na ndị n'enweghị Gị n’ụwa.

Mana ugbu a, Chineke anyị, n'ime Kraịst Jizọs, e mewo ka anyị bụ́ ndị nọ n’ebe dị anya n’oge gara aga, dịka ndị mejai ahụ, bịaruo Gị nso site n’ọbara Kraịst.

Ekeresimesi bụ ekele anyị n'enye maka amara Gị, ọ bụghị n'ihi iru erú anyị. Amụma Ọkwa Ọbịbịa na-egosi ọbịbịa Gị n'ime Kraịst iji dọpụ anyị na mmehie anyị, ya kpatara anyị jiri na-abịakwute Kraịst gbuo ikpere n'ala n'ofufe.

Ọ bịaghị ịkpọ ndị ezi omume kama ọ bụ ndị mmehie ka Ọ bịara ịkpọ. Nnupụ-isi anyị na ọtụtụ ọdịda anyị meworo doro anyị ezigbo anya, anyị ji obi anyị niile na obi ụtọ wee n'akpọ isiala enye Ọkpara Gị.

N’aha Ya ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.

Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Praying With Wonder Through Christmas

Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Good Book maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thegoodbook.com/the-christmas-we-didnt-expect