Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Atụ
Ka anyị kpee ekpere:
Nna anyị bi n'elu-igwe, anyị na-arịọ Gị na n'ime ememe nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa a, na Ị ga-eme ka o dee edè n'ime mkpụrụ obi anyị ihe ọbịbịa Ọkpara Gị pụtara.
Jizọs abịaghị ka Ọ kpaa ndị mmadụ ọchị ma ọ bụ mee ha obi aṅụrị. Ọ bịaghị naanị ime ka anụ ma ọ bụ kọọ akụkọ dị egwù gbasara Ya.
Ọ bịara iweghachita anyị bụ ndị nnupụisi n'akụkụ Chineke anyị. Otú mmadụ si ahụta Amụma Ọkwa Ọbịbịa bụ nke nkeonwe.
Mee ka anyị bịaruo nso n’ụbọchị ndị a n’obi nke Kraịst, nke bụkwa obi Gị, meekwa ka ọbịbịa mbụ Ya, n’eziokwu ya na uru ya niile, dịkwuo irè na ndụ anyị.
N’aha Jizọs ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.
More