Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Atụ
Ka anyị kpee ekpere:
Nna anyị nke bi n'elu-igwe, mee anyị ka anyị dịkwuo ka ndị-ọzùzù-aturu ahụ, ndị jere hụ Jizọs n'oge a mụrụ Ya, n'enye Gị otuto site n'ọṅù-anyị n'ime Gị, n'etokwa Gị site n'okwu-anyị na àmà anyị n'agba n'ụwa.
Anyị achọghị ime ka à ga-asị na anyị bụ ndị siri ike na ndị amamihe na ndị n'adịghị eme mmejọ ọbụla.
Adịghị nma anyị doro anyị anya ya wee ju anyị anya na Ị zitere Ọkpara Gị site n'ebe kachasị elu nke elu-igwe gbadata n'ebe kasị ala n'ụwa ikwusa na imezu ozi ọma a bụ nke oké ọṅụ.
N’aha Ya ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.
More