Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Atụ
Ka anyị kpee ekpere:
Nna, Ọkpara Gị dị anyị ịtụ n'anya.
Ọ bụ Chi zuru okè n'Onwe Ya, Gị na Ya nọkwa na mmekọrịta chiri-anya n'adịghị agwụ agwụ, site n'ebighị ebi ruo n'ebighị ebi, ma n’agbanyeghị nke ahụ, Ọ ghọrọ mmadụ wee bụkwasi Onwe Ya mgbu na ntaramahụhụ niile nke ụwa anyị na-arịa ọrịa mmehie, ka O wee zọpụta anyị.
Ịhụnanya Gị n’ebe anyị nọ n’ime na site na Kraịst karịrị nchọpụta anyị n'uju, mana anyị chọrọ ịmatakwu banyere ya. Nke anyị ma ama na-akpata inye Gị ekele kwa ekele.
Anyị ji ịhụnanya na-asọpụrụ Ọkpara Gị, Nna anyị hụrụ anyị n’anya, ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ịmatakwu Ya na ịnụkwu ụtọ Ya, karịkwa n’oge Amụma Ọkwa Ọbịbịa a.
N’aha Jizọs ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.
More