Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ EkeresimesiIhe Atụ

Praying With Wonder Through Christmas

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Ka anyị kpee ekpere:

Nna Anyị Chineke, Ị n'eweda ndị-npakó ma n'ebuli ndị dị ume-ala elu, anyị ewee n'atụ egwù aka ọrụ Gị a.

Anyị ghọtara na otú anyị si enwe mmetụta adịghị-ike, ike ọgwụgwụ, na nyigbú ibu arọ ná Amụma Ọkwa Ọbịbịa a nwere ike ịpụta na anyị nọ kpọmkwem ebe Ị chọrọ ka anyị nọrọ.

Ị zitere Ọkpara Gị inyere ndị na-adịghị ike na ndị ike gwụrụ aka. Meghee anya anyị ka anyị hụ adịghị-ike anyị n'eleghara anya ma ọ bụ ndị anyị na-agbalịsi ike ikpuchi.

N'ime Ọkpara Gị, anyị dị nchekwa ikwupụta ha n'enweghị ihere, jiri obi umeala bịakwute Gị, inwe aṅụrị na Gị na n'ime ogwe-aka Gị dị ike, a bụghị nke anyị dara mbà.

Mee ka Onwe Gị dị elu n'ime anyị oge a site ná nṅụrị-ọṅụ anyị n'ime Gị na n'ime Ọkpara Gị.

N’aha Ya ka anyị na-ekpe ekpere. Amen.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Praying With Wonder Through Christmas

Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Good Book maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thegoodbook.com/the-christmas-we-didnt-expect