Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Otu Esi Amụ Akwụkwọ Nsọ (Ntọala Ya Gasị)Ihe Atụ

How To Study The Bible (Foundations)

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Nnukwu Ọmụmụ Nke Akwụkwọ Nsọ Dị Ike Ime Ngbanwe

Ndị dị njikere ịbụ ndị na-adịghị ike na-ejegharị n'etiti ihe omimi. — Theodore Roethke

Were ya na ị banyere n'ụlọ ọrụ onye dọkịta n'ihi na ahụ adịghị gị mana kama iji tamometa eme ihe otú o kwesịrị (site n'itinye ya n'ọnụ, ntị, ma ọ bụ n'elu ihu gị), e tinye ya n'aka gị. Mgbe sekọnd ole na ole gachara, nọọsụ ewee bulie ya ma gwa gị na ka ahụ gị si anụ ọkụ dị nma.

Kedụ ka ị ga-esi zaghachi? Ihe nọọsụ gụrụ ga-adịnu nma, n'ihi na ejighị tamometa mee ihe ka o kwesịrị.

N'ọnọdụ ahụ, ka e jiri ya mee ihe n'ụzọ ahụ, ihe kacha mma tamometa ahụ nwere ike ime bụ ịgụ okpomọkụ nke ime ụlọ ahụ ọ nọ. Ọ bụghị na tamometa n'onwe ya mebiri emebi ma ọ bụ na odịghị arụ ọrụ. Ọ bụ na ejighị ya mee ihe n'ụzọ kwesiri ekwesi.

N’otu aka ahụ, mgbe anyị debere Akwụkwọ Nsọ n’ebe dị anya, anyị na-efunahú nnukwu ike, eziokwu, na ndụ nke dị adị n'eché ka anyị ji ha wee mee ihe. Akwụkwọ Nsọ bụ otu n’ime ụzọ ndị bụ́ isi Chineke họọrọ ikpughere anyị Onwe Ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe, bụrụ, ma mee ihe niile Chineke zubere, ha niile na-amalite site na iji ngwá na ebumnuche ziri ezi na-abịakwute Akwụkwọ Nsọ.

Nye ije m dị kà onyé nke Kraịst, ndị a bụ ogidi asaa dị irè (na dị mgbanwe) nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ:

  1. Nhọta amaokwu Akwụkwọ Nsọ n'ụzọ esiri kwuo ya.
  2. Nwulite àgwà nke ịgụ Akwụkwọ Nsọ.
  3. Ime omume nke ibu amaokwu n'isi.
  4. Iji ngwá ọrụ kwesiri ekwesi amụ Akwụkwọ Nsọ.
  5. Imụ Akwụkwọ Nsọ n'etiti ọgbakọ ziri ezi.
  6. Itinye ekpere na ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ.
  7. Nhuta onwe dịka adịghị ike iji too n'ihe nke ime mmụọ.

Ije nke gị nwere ike ịgụnye karịa ihe ndị a, mana ihe asaa ndị a ga-adiriri n'ime ya. Ha enyerela m aka ito eto karịa ka m chere na ọ ga-ekwe omume, ekwenyekwara m na ha pụrụ imere gị otu ahụ.

Ọ bụ ekpere m na atụmanya m na i ga-amụta iji mmasị dị ọkụ hụ Okwu Chineke n'anya. Nke ikpeazụ, na O ga-abụ n’ezie oriọna nye ụkwụ gị na ìhè nye ụzọ nke ndụ gị.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

How To Study The Bible (Foundations)

Ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịda mbà n'obi, ejighị na enweghị ngwaọrụ kwesiri-ekwesi, na amaghị ihe e kwesịrị ime ma abịa na ọgụgụ na mmụta Okwu Chineke. Ebumnobi m bụ ime ka usoro ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ dị mfe nye gị n'ụzọ ole na ole site n'ịkụziri gị ụkpụrụ atọ kachasị mkpa nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ iga nke ọma. Sonye na atụmatụ ihe ọgụgụ a wee chọpụta ka esi agụ Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị maka ozi, kama maka mgbanwe ndụ, ụbọchị taa!

More

Anyị ga-achọ ikele Faithspring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: http://www.ramosauthor.com/books/