Otu Esi Amụ Akwụkwọ Nsọ (Ntọala Ya Gasị)Ihe Atụ
Ihe Mere Ịmụ Akwụkwọ Nsọ Ji Dị Mkpa
Ọ gaghị ekwe omume ịmata Chineke ma ọ bụrụ na anyị amaghị Akwụkwọ Nsọ.
Echetara m oge mbụ m nụrụ okwu a. Abụ m onye Kraịst na-eto eto nwere mmasị ịhọrọ ihe ziri ezi ga-eduru obi m gaa n'ọchịchọ ziri ezi. Amaara m na Chineke dị ike ịgbanwe ndụ m, mụ ewee chọọkwa ịmata Ya nke ọma.
Kedụ ihe Chineke dị ka? Gịnị ka Ọ chọrọ n'aka m? Ọbịbịa m n'ụwa a bụ maka gịnị
N’ime afọ iri sochirinụ, etinyere m onwe m n'ọrụ ịmụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma ka m wee nwee ike mata Chineke nke ọma. Mkpebi ahụ m mere durulà m gaa n'ụzọ mara mma m n'atụghị anya.
Ihe òfùfè a dị nkenke bụ nkọwa nke nghọta ole na ole bara uru m chepụtara n'ime afọ iri gara aga. Ị ga-achọpụta usoro, ngwa ọrụ, na ụzọ bara uru ga-enyere gị aka inweta ihe kacha mma n'oge agụm Akwụkwọ Nsọ gị, yana agbamume ikwere na ịmụta Akwụkwọ Nsọ gị baara gị uru nke ukwuu n'agbanyeghị ọrụ dị n'ịmụ Ya, n'ihi na ụgwọ ọrụ gị bụ Chineke n'Onwe Ya.
Mee ihe ịma aka a wee mụta ka ị ga-esi gbanwee ahụmịhe i n'enweta n'Akwụkwọ Nsọ ka o si na ihe dị gị ka ọrụ n'enye nsogbu baa na ihe i ji ọṅụ eme oge niile. Chineke n'eche gị ka ị matakwuo Onye Ọ bụ. Ọ kpọọla gị òkù ahụ dị ukwuu. Ihe ọzọ ga-emenụ́, dị gị n'aka.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịda mbà n'obi, ejighị na enweghị ngwaọrụ kwesiri-ekwesi, na amaghị ihe e kwesịrị ime ma abịa na ọgụgụ na mmụta Okwu Chineke. Ebumnobi m bụ ime ka usoro ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ dị mfe nye gị n'ụzọ ole na ole site n'ịkụziri gị ụkpụrụ atọ kachasị mkpa nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ iga nke ọma. Sonye na atụmatụ ihe ọgụgụ a wee chọpụta ka esi agụ Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị maka ozi, kama maka mgbanwe ndụ, ụbọchị taa!
More