Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Otu Esi Amụ Akwụkwọ Nsọ (Ntọala Ya Gasị)Ihe Atụ

How To Study The Bible (Foundations)

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ngwáọrụ Dị Mma Na-akwado Nnukwu Ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ


Odịnma nwoke n'aka ọrụ ya dabeere na ngwaọrụ ọ ji arụ ọrụ. – Emmert Wolf


Otu n'ime ihe kachasị amasị m ime n'ụbọchị ọbụla m nwere ezumike n'ọrụ bụ ịnọdụ ala n'aṅụchatu iko ihe ọṅụṅụ ginger-lemon tii m dị ọkụ ma na-ekiri ndị na-esi nri na Tv. Ọ bụ ihe nnukwu nkiri ịlele onye nwere nkà n'isi nri ka ọ n'esi nri ya. Ihe ọ bụla ha na-eme bụ nke ha ji nzube kwadoo site na nwepụta ihe ndị ha ji eme ka nri ha sie isi ọma, ruo n’ụdị okpomọkụ ha na-edebe nri ha n'elu ya, gbada na n’ụdị efere mara mma ha na-edebe ihe ha siri ma ha mechaa.

Ọ bụrụ na gị ajụọ ndị a nwere nnukwu nkà n'isi nri ihe dị mkpa karịsịa maka isi nri, 99% n'ime ha ga-enye otu azịza: ọ bụ ihe ndị eji esi yabụ nri. Ka ihe ndị eji esi nri si dị mma, emebighị ma ọlị na dị ụkọ n'ahịa, ka yabụ nri mgbe e sichara ya ga-esi tọọ́ ezigbo ụtọ, nwe isi ọma na magbuo onwe ya ile anya.

Nye ndị na-amụ Akwụkwọ Nsọ, ihe ndị anyị ji esi nri n'ụzọ a bụ ngwáọrụ gasị anyị ji enyere onwe anyị aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ngwáọrụ dị mma mụọ Okwu Chineke, anyị ga-azụlite nghọta dị uju banyere ihe dị n'ime Akwụkwọ Nsọ ma mụta otú esi etinye eziokwu ndị na-adịghị agafe-agafe nke dị n’ime Okwu Chineke, n’ọrụ. Ma ọ bụrụ na anyị ejiri “ngwaọrụ” n'ezughị ezu ma ọ bụ ndị n'ezighi ezi, nghọta anyị nye Akwụkwọ Nsọ ga-adị mkpụmkpụ ma eleghị anya ọbụna duba anyị n'ụzọ dị ize ndụ.

2 Timoti na-agba anyị ume ka anyị bụrụ ndị ọrụ bụ́ ndị dị ike “ijizi” “okwu nke eziokwu ahụ” n’ụzọ ziri ezi wee n'eme ihe. Ụzọ kachasị mma m maara ka esi eme nke a bụ:

  1. Chọta ngwáọrụ gasị e nwere dịnụ ga-enyere gị aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.
  2. Kpee ekpere ka Chineke duru gị gaa n'aka onye ndụmọdụ-Chineke gá enyere gị aka iji ngwa ndị a mee ihe.

Ugbu a, ọ nwere ike ịbụ ihe mgbagwoju anya nye gị n'ihi ngwaọrụ dị iche iche jupụtaranu i n'ahụ. Enwere nkọwa gasị ndị mmadụ mere, akwụkwọ nkọwa okwu dị iche iche, akwụkwọ nkà mmụta jụrụ ụwa ọnụ, akwụkwọ nduzi ụzọ nọ ebe niile, ngwá eji amụta asụsụ kárírí ọnụọgụgụ, na ndị ọzọ. Ngwá ọrụ mbụ m na-agba ụmụ akwụkwọ m ume mgbe niile ka ha jírí malite, dị mfe: ntụgharị asụsụ mgbagwoju anya adịghị ya.

A na m enye Chineke ekele na ngwaọrụ dị ka ngwá Baịbụl nke YouVersion na-eme ka ọ dị mfe ịnweta ọtụtụ ntụgharị asụsụ bara uru. Nke a bụ ebe m na-agba gị ume ka i sirí bido.

E nwere akụ dị n'Okwu Chineke na-echere ndị dị njikere izobanye ụkwụ inweta ya.


Ntụnye Bara Uru: Ị chọrọ̀ itokwu n'ime ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ gị mana ị maghị ebe ị ga-amalite? Họrọ otu n'ime amaokwu kachasị amasị gị wee depụta ya na mpempe akwụkwọ n'ụzọ ntụgharị asụsụ ise nke yabụ amaokwu. O nwèrè ndịiche/myirita ị na-ahụ? Mmata gị dị ka onye na-agụ ihe bụ otu n'ime ngwaọrụ kachasị mma i nwere.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

How To Study The Bible (Foundations)

Ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịda mbà n'obi, ejighị na enweghị ngwaọrụ kwesiri-ekwesi, na amaghị ihe e kwesịrị ime ma abịa na ọgụgụ na mmụta Okwu Chineke. Ebumnobi m bụ ime ka usoro ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ dị mfe nye gị n'ụzọ ole na ole site n'ịkụziri gị ụkpụrụ atọ kachasị mkpa nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ iga nke ọma. Sonye na atụmatụ ihe ọgụgụ a wee chọpụta ka esi agụ Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị maka ozi, kama maka mgbanwe ndụ, ụbọchị taa!

More

Anyị ga-achọ ikele Faithspring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: http://www.ramosauthor.com/books/