Otu Esi Amụ Akwụkwọ Nsọ (Ntọala Ya Gasị)Ihe Atụ
Nnukwu Ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ Bụ Ihe A Na-eme Mgbe Ọ Bụla
Anyị na-aghọ ihe anyị na-eme ugboro ugboro. – Sean Covey
Ma anyị ma ya ma ọ bụ na anyị amaghị, ndụ anyị gbadoro ụkwụ na omume anyị. Ihe anyị na-eri, otu anyị si emeghachi omume nye nsogbu bịakwutere anyị, ma anyị na-agbanyu ihe oge n'akpote anyị n'ụra ma ọ bụ na anyị agbanyụghị – ihe ndị a niile bụ àgwà ndị anyị kwere ka ha were ọnọdụ na ndụ anyị.
Onye edemede Charles Duhigg na-ede na ihe dịka 45% nke ihe niile anyị na-eme n'ụbọchị, kwa ụbọchị, bụ ihe ndị anyị n'emekarị dịka àgwà. Ọ bụrụ na ị nwere àgwà ọma, nke ahụ ga-abụ ihe agbamume nye gị. Mana ọ bụrụ na omume gị abụghị ihe ndị ga-enyere ndụ gị aka, nke ahụ pụtara na ọkara mkpebi niile ị nwere ohere ime bụ nke ahọrọlarị maka gị (bụ ndị jọgburu onwe ha).
Ana m agwa gị nke a n'ihi na achọrọ m ka ị ghọta na ọ dị mkpa n'ezie ịgụ Okwu Chineke mgbe niile.
Gịnị mere ndị dike nke okwukwe anyị na-ahụ na Akwụkwọ Nsọ ji dị irè? O bụ n'ihi na oge n'ebe Chineke nọ na oge n'Okwu Ya bụ ihe a na-apụghị ịgbagha agbagha kwa ụbọchị ndụ ha.
N’agbanyeghị mmehie na mmejọ nile nke Eze Devid, ọ nọgidere na-alọghachi n’Okwu Chineke, na-agbanwe ndụ ya dị ka ihe O kwuru si dị, ma na-emetụta nke ọma akụkọ ihe mere eme nke ụmụ Izrel n’ihi ya.
Pọl tolitere bụrụ onye Farisii ndụ ya kwụ chịm n'Okwu Chineke ma bụrụ onye bu Okwu Chineke n'obi ya. Mana ozugbo Jizọs tụgharịrị ndụ ya, o ji obi ike ọhụrụ bịakwute Okwu Chineke ma mezuo nzube ndụ ya n’ihi Ya.
Ọ bụrụ na o nwere onye pụrụ iganari ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ọ bụ Jizọs. Mana ugboro ugboro, anyị na-ahụ ka Jizọs na-ezopu igụ na ikpe ekpere n'ebe dị jụụ. Ọ ghọtara nke ọma karịa onye ọ bụla n'ime anyị, etu o siri dị oké mkpa ka abụ-mmadụ anyị dị mmezi na ngọzi site na nzukọ anyị na Chineke.
Ntụnye-Aka Bara UruỊ na-agbasi mbọ ike ịgụ Baịbụl gị mgbe niile? Mepee Ya ma dowe ya nso ọnụ ụzọ ebe i n'ehi ụra ma ọ bụ ebe i n'esi nri gị. N'ụzọ dị otu a, ka i n'ejeghari n'eme ihe n'ụbọchị gị niile, ị ga-agụ opekata mpe otu amaokwu ka ị na-apụ ma n'abata n'onu ụzọ ndị a. Ebumnobi nke imepụta àgwà siri ike nke ịgụ Akwụkwọ Nsọ bụ ime ka ọ dị mfe (otu amaokwu kwa oge) na ịdị n'ụzọ ahụrụ anya (ịdị mmepe na dị n'ebe i n'ahụ Ya anya oge niile).
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịda mbà n'obi, ejighị na enweghị ngwaọrụ kwesiri-ekwesi, na amaghị ihe e kwesịrị ime ma abịa na ọgụgụ na mmụta Okwu Chineke. Ebumnobi m bụ ime ka usoro ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ dị mfe nye gị n'ụzọ ole na ole site n'ịkụziri gị ụkpụrụ atọ kachasị mkpa nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ iga nke ọma. Sonye na atụmatụ ihe ọgụgụ a wee chọpụta ka esi agụ Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị maka ozi, kama maka mgbanwe ndụ, ụbọchị taa!
More