Otu Esi Amụ Akwụkwọ Nsọ (Ntọala Ya Gasị)Ihe Atụ
Nnukwu Ọmụmụ Nke Akwụkwọ Nsọ Bụ Nke Eji Ekpere Akwado.
Ịbụ Onye Kraịst n'adịghị ekpe ekpere agaghị ekwe omume n'ihi na ọ dị ka ịdị ndụ ma adịghị eku ume. — Martin Luther
Otu n'ime nri kacha a mmasị m bụ anụ ọkụkọ ederè edè n'ime ihe na-atọ ụtọ. N'ọnwa gara aga, elere m anya na usoro e jị esi ụdị ọkụkọ ahụ ka m wee mata ihe mere o ji atogbu onwe ya n'ụtọ. Nke a bụ ihe m chọpụtara.
Mgbe a na-edè nri, ihe dị ka anụ ọkụkọ, a na-eji mmiri acid (dị ka vinegar ma ọ bụ lemon) kpuchie ya. Mmiri acid ahụ na-akụrisị ahụ anụ ahụ nke n'eme ka ihe ụtọ ndị eji esi ya bamie na mikpuo n'ime ya nke ọma.
Idè nri n'ewe oge. Ị gaghị atonye anụ ọkụkọ n'ime ihe iji edè nri nwa oge wee chee na ọ ga-atọ ụtọ ka i si chọọ. Ịkwesịrị ịnye usoro idè nri ahụ ezigbo oge ka o wee rụọ ọrụ.
Ekpere bụ otù Onye Kraịst si eme odìdè. Ikpe ekpere n'ime na jiri Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị ohere ịnọdụ ala n’eziokwu nke Chineke ruo ogologo oge n’ụzọ ga-eme ka O tirisie ihe mgbochi nke anụ ahụ anyị wee tụọ anyị “ụtọ ime” karịa ka anyị pụrụ ịbụ n'onwe anyị.
Buru nke a n’uche, ka m gwa gị ekpere m na-ekpe oge ọ bụla m welitere Akwụkwọ Nsọ m:
Onye-nwe-m, biko mee m ka m dị oghé nye Okwu Gị, meekwa ka Okwu Gị dị oghé nye m.
Nke a na-akwadó uche m na obi m ka ihe dị ịtụnanya mee n'ime ha ka m na-agụ Akwụkwọ Nsọ m kwa ụbọchị. Achọrọ m ịdị ngbanwe. Achọrọ m ka Mmụọ Nsọ kpugheere m ìhè nke Okwu Chineke. M wee n'eme ka ebumnobi ndị a pụta ìhè site n'ikwupụta ekpere a dị nkenke.
Enwere ọtụtụ ụzọ (karịa narị) isi tinye ekpere n'ime na gburugburu oge ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ gị. Maka ugbu a, a na m agba gị ume ka ị n'ekpe obere ekpere a ma hụ mgbanwe ọ ga-eme na ndụ gị.
Ntụnye Bara Uru: Ị na-enwe nkụda mmụọ n'ekpere n'ihi na ọ na-adị gị ka Chineke anaghị anụ ma ọ bụ aza ekpere gị? Ka m nye gị ndụmọdụ pastọ m nyere m: anya gị dị oké elu, wedata ya. Ọtụtụ ndị mmadụ n'eche na ịnụ olu Chineke bụ nke na-abịa site na ihe ịrịba ama n'eme, ma ọ bụ ihe ukwu n'agbanwe ndụ. Nke bụ eziokwu bụ na, Chineke na Mmụọ Nsọ na-agwa gị okwu kwa ụbọchị (ọbụna ọtụtụ ugboro kwa ụbọchị!). Ibudata anya gị dị oké elu pụtara (1) Ịtụ anya na Chineke ga-agwa gị okwu na (2) ịdị ike n'achọ ụzọ obere obere O si agwa gị yabụ ókwú. Ọ dịghị mkpa ka i nwe ahụmahụ ohia na-ere ọkụ iji zute Chineke; mgbe ụfọdụ, abụ ziri ezi n'akụ na redio pụrụ imezu otu ihe ahụ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịda mbà n'obi, ejighị na enweghị ngwaọrụ kwesiri-ekwesi, na amaghị ihe e kwesịrị ime ma abịa na ọgụgụ na mmụta Okwu Chineke. Ebumnobi m bụ ime ka usoro ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ dị mfe nye gị n'ụzọ ole na ole site n'ịkụziri gị ụkpụrụ atọ kachasị mkpa nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ iga nke ọma. Sonye na atụmatụ ihe ọgụgụ a wee chọpụta ka esi agụ Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị maka ozi, kama maka mgbanwe ndụ, ụbọchị taa!
More