Ubọchi Isii Nke Aha Ndi Nke ChinekeIhe Atụ

Ụbọchị Nke Anọ: ESH OKLAH – Ọkụ Na-Erepịasi Ihe Niile
Ị hụtụla mbibi nke ọkụ ọhịa mere? Ọ na-erepia ihe niile dị n'ụzọ ya, na-amafe okporo ụzọ na àkwà mmiri ma osimiri ngwa ngwa. Ugbu a, were anya uche gi hụta ọkụ na-erepịasi ihe niile nke karịrị eluigwe na ụwa, ị ga-amalite ihụtatụ nke obere ọtụ ike nke Chineke di.
Anyị kwesịrị ịkwanyere ike nke Chineke di ukwuu ùgwù, ma anyị kwesịkwara icheta na Ọ bụ Chineke nke chọrọ mmekọrita anyi na Ya n'echekwa echiche di ukwuu banyere anyị. N’ihi nke a, Ọ bụ Chineke nke kwesịrị otuto na ofufe anyị mgbe niile. Anyị ekwesịghị iji Ya egwụri egwu, ma anyị ekwesịghịkwa ịtụ egwu itikụ Ya makwa ibanye n'ime mmekọrita nke anyị na Ya.
Ịdị ukwuu nke Chineke nwere ike isi ike nghọta, dị ka anya Ya si nwee ike ịhụ nkọwa niile nke ndụ anyị. Olee otú otu onye dị ezigbọ ike otu ahu ga-esi n'eche echiche banyere ihe ndị yiri ihe na-adịghị mkpa nke ndụ anyị? Ọ bụ n’ihi na Ọ bu ihe ndi gbasara anyi n'obi Ya nke ukwuu. Ya mere anyị kwesịri ikwe ka ọkụ Ya nke na-erepịasi ihe niile na-enwụsi ike n’ime obi anyị.
Ọ bụ Esh Oklah, ọkụ na-erepịasi ihe niile, ma bụrụkwa ọkụ nke jụpụtara n’amara na ndidi na nnukwu obi ebere. Ọ na-adọta anyị n’ebe Ọ nọ site n’ebumnọbi ime ka anyị mee Ya ka Ọ bụrụ ụzọ n’ime obi anyi, echiche anyi na mkpụrụ obi anyị. Ma n'ime etiti ọkụ ahu, Ọ na-azụlite ịhụnanya n’ime obi anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ọ kpụghewọrọ anyị ihe ndi dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ na-egọsi ihe karịrị iri asatọ bu aha Chineke dị iche iche. E nyere ebe a aha isii na ihe ha pụtara iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Ọtu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Nraranye Na-Enye Ndụ , nke Dr. Tony Evans dere. Eugene, OR: Ndị Mbipụta Ụlọ Owuwe Ihe Ubi, 2017.
More