Ubọchi Isii Nke Aha Ndi Nke ChinekeIhe Atụ

Ụbọchị Nke Abụọ: ELOHE CHASEDDI – CHINEKE NKE EBERE
Ndụ anaghị ekwe anyị nkwa maka ohere nke abụọ mgbe niile. E nwere mgbe mkpebi anyị na-adịghị mma—okwu ọjọọ anyi gwara enyi anyị, mmejọ anyị mere n’ebe ọrụ anyi, nhọrọ ndụ ndị na-adịghị mma—na-eri anyị ọnụ. Anyị na-efunahụru mmekọrita anyi na enyi anyi. A na-achụ anyị n'ọrụ anyị. Ahụ ike anyị n'ata ahụhụ. Ọbụlagọdi na anyị nwere mgbanwe nke obi, enweghị mmesi obi ike na ihe niile ga-adị mma.
Otú ọbula ọsiri dị, ebere Chineke na-enye anyị ohere nke abụọ kwa abụọ mgbe ohere nke abụọ gasịrị. Elohe Chaseddi—Chineke nke ebere—na-awusa anyi mgbaghara ma jiri obioma nke ịhụnanya sachaa anyị ahu. Ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile. N'eme ebere mgbe niile. N'enwe obi mmetụta di ukwụụ mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Ya n'anya ma rịọ Ya maka mgbaghara Ya, Ọ na-enye anyi ya. Mgbe niile.
N'ihi na Ọ bụ Chineke nke ebere, anyị nwere ike ibi ndụ n'atụghị egwu. Anyị na-enweta udo nke uche na nke obi mgbe niile nke Ọ na-enye n'ụba n'ụba. Ọ kwere nkwa na Ya ga-anọnyere anyị mgbe niile ma kpọfeta anyị n'ọnọdụ nsogbu ọ bụla na oge niile siri ike. Ọbụlagọdi mgbe mmejọ bu nke anyị mere, Ọ na-adị njikere rụọ mgbe ebighị ebi inye obi chegharịrị ēchighari mgbaghara.
Kama ichegbu onwe anyị maka ụnyaahụ, Chineke chọrọ ka anyị lekwasị anya na ubọchi taa. Olee otú anyị ga-esi jeere Ya ozi taa? Olee atụmatụ Ọ nwere ka anyị mezụọ taa? Olee otú anyị nwere ike isi kerịtara Ya ndị ọzọ taa? Nke ahụ bụ ịma mma nke ebere—ohere nke abụọ, na ile anya n'ihu, na-elekwasị anya na ọdịnihu Ọ nwere maka anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ọ kpụghewọrọ anyị ihe ndi dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ na-egọsi ihe karịrị iri asatọ bu aha Chineke dị iche iche. E nyere ebe a aha isii na ihe ha pụtara iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Ọtu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Nraranye Na-Enye Ndụ , nke Dr. Tony Evans dere. Eugene, OR: Ndị Mbipụta Ụlọ Owuwe Ihe Ubi, 2017.
More