Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ubọchi Isii Nke Aha Ndi Nke ChinekeIhe Atụ

Six Days Of The Names Of God

ỤBỌCHỊ 1 NKE 6

Ụbọchị Nke Mbu: EL EMUNAH – CHINEKE KWESIRI NTỤKWASỊ OBI

Ọ na amasi anyị iche na anyị bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị na-abia ọrụ n'oge (ekwuwe ya, mgbe kwa mgbe) ma di ụchụ n'irụ ọrụ anyị. Anyị na-ewepụta oge maka ezinụlọ na ndị enyi. Anyị na-etinye aka n'ọrụ ụlọ ụka anyị ma debanye aha anyi maka ihe kọmitii na ọrụ ohere. Ma n’agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike ibu ndi kwesịri ntụkwasị obi, anyị ezụghị okè. Ma anyi chọrọ ma anyị achọghi, anyị ga-ahapụriri ibia nzukọ ma ọ bụ hapụ ibia egwuregwu bọọlụ nwata ma ọ bụ chefụọ ọrụ ohere ahụ.

Ebe ọ bụ na anyị apụghị ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe nile, ọ na-emesi obi ike ịmara na anyị na-ejere Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ozi. Aha Ya El Emunah pụtara “Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,” na enwere ike ịtụkwasị Ya obi mgbe niile ka Ọ za anyi, welie aka uwe Ya ma bidọ rụwa ọrụ n'ime ndụ anyị. Ọ na-emezu nkwa Ya mgbe niile? Ee. Ọ na-anụ ekpere anyị mgbe niile? Ee. Ọ na-anọnyere anyị mgbe niile? Ee.

Ihe na-eme na ndụ anyị na-eme ka anyị ghara ibụ kpam kpam ndi ekwesịri itụkwasị obi nye ndị ọzọ. N'ihi na anyị bụ mmadụ, anyị nwere ọnwụnwa ime nhọrọ dabere na nchekwa onwe anyị, ịchọ ọdịmma onwe anyi na anyaukwu. Itinye ya n'ụzọ dị mfe, anyị enweghị ike ịdị izu oke mgbe niile. Ma mgbe anyị n'emeghi ihe ndi elere anyi anya ime, Chineke na-eme ha. Ma Ya ejikwa nwayọọ dụghachi anyị azụ n’ọrụ Ọ nwere maka naani anyi ka anyị na-arụ—ọrụ nke ibu ndi ekwesịri itụkwasị obi na imere ndi mmadu ihe ha lere anyi anya ka anyi meere ha. Mgbe anyị tụgharịrị gaa n’izu okè nke Ya n’oge anyị n'adighi izu okè, ikwesị ntụkwasị obi Ya na-agbanwe anyị.

Ọ bụrụ na ịhụtara ihe ọmụmụ ofufe a dika ihe bara uru, anyị chọrọ inye gị onyinye mbụdata nkuzi nke okwuchukwu di n’aha Jehova Jire.Rịọ n'uju nkuzi nke okwuchukwu nke Tony Evans ebe a.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Six Days Of The Names Of God

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ọ kpụghewọrọ anyị ihe ndi dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ na-egọsi ihe karịrị iri asatọ bu aha Chineke dị iche iche. E nyere ebe a aha isii na ihe ha pụtara iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Ọtu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Nraranye Na-Enye Ndụ , nke Dr. Tony Evans dere. Eugene, OR: Ndị Mbipụta Ụlọ Owuwe Ihe Ubi, 2017.

More

Anyi ga achọ ikele The Urban Alternative na Tony Evans maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na https://tonyevans.org/