Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ubọchi Isii Nke Aha Ndi Nke ChinekeIhe Atụ

Six Days Of The Names Of God

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

DAY 3: JEHOVAH JIREH – JEHOVA GA-ENYE

Ị jighị n'aka otu ị ga-esi akwụ ụgwọ gị n'ọnwa a. Ọnọdụ mmekọrịta gị na onye ihụrụ n'anya dị n'elu ka ikuku. Ị nụla na mbelata ọrụ na-abịa n'ebe ọrụ gi, ma ijighi ọnọdụ gị n'ime ụlọ ọrụ gi n'aka. Mgbe ihe ndị bụ́ isi ná ndụ nọ n’ihe ize ndụ—ahụ ike, ego, ebe obibi, nri, ezinụlọ, ọrụ—ọ bụghi ihe itunanya ma ọbụrụ na egwu bidọrọ tuwa gi, dị ka à ga-asị na ọ nweghị ebe ị ga-agbaba. Ọ bụ mgbe ahụ ka i kwesịrị ịkpọkụ Jehọva Jireh. Aha Chineke a agọziri agọzi pụtara “Onye-nwe-anyị ga-enye,” nakwa ọ bụ aha jụpụtara n’ike na ikikere.

Mgbe anyị na-atụ ụjọ maka ọdịnihu anyị, ọ dị mkpa ka anyị tụgharia ebe Chineke nọ ma kpọkụọ aha Ya. Onyinye ọma na nke zuru oke n'esite na Ya abịa, ma enweghị ogige agbara onyinye na ngọzi Ọ na-enye. Ịtụkwasị okwukwe anyị na Ya mgbe ụfọdụ pụrụ ịbụ nanị ụzọ anyị ga-esi mee ka egwu anyị dajụọ ma mee ka anyị nọgide n'ezi uche.

Ọ pụrụ ịbụ ihe mmụta siri ike ịmụta, mana ọnwụnwa ndị ana-enwe n’ụwa a na-ewusi akwara ime mmụọ anyị ike ma na-adọta anyị nso na Chineke. Site na mgba anyị, Ọ na-egosi anyị n'onwe anyị ka Ọ si enye ngụgụ anyị ikuku iji wee kụọ ume na ìhè ka anya anyị ji wee hụ uzo. Ọ na-enye anyị kpọmkwem ihe dị anyị mkpa iji wee wepụta ụtọ kacha ukwụụ n'ime anyị na mmetụta kachasị nke niile maka alaeze Ya. Ọ na-enyekwa ya mgbe niile n'ime mmụọ nke ịhụnanya.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Six Days Of The Names Of God

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ọ kpụghewọrọ anyị ihe ndi dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ na-egọsi ihe karịrị iri asatọ bu aha Chineke dị iche iche. E nyere ebe a aha isii na ihe ha pụtara iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Ọtu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Nraranye Na-Enye Ndụ , nke Dr. Tony Evans dere. Eugene, OR: Ndị Mbipụta Ụlọ Owuwe Ihe Ubi, 2017.

More

Anyi ga achọ ikele The Urban Alternative na Tony Evans maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na https://tonyevans.org/