Okwukwe na-amasị ChinekeIhe Atụ
Okwukwe na-ele anya karịa anụ ahụ
Ihe Ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ: Ndị Hibru 11:9 Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ.
Ihe mara mma banyere okwukwe nke Akwụkwọ Nsọ bụ na, ọ na-eme ka onye kwere ekwe lekwasị nlebara anya ya n’ebe Chineke nọ. Okwukwe nke Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe niile bụrụ ihe gbasara Chineke. Ihe nlekwasị anya a na-enyere onye kwere ekere aka ka o dozie nlebara anya ya na ihe ndị nwere uru ebighị ebi.
Ihe ọbụla a na-ahụ n'anya ma ọ bụ ihe onwunwe ọbụla ị nwere ike ịnata site na Okwukwe nwere nzube dị n'okpuru ya, - ya bụ iji chegharịa uche gị n’ebe onye na-eweta ya nọ.
S’ite n'okwukwe, Ebraham bụ onye nwere ọtụtụ ihe onwunwe a na-ahụ anya, mana ị ma ihe merenụ? Ọ bụ onye biri ndụ ya ma lebiga anya gafee ugbu a. Ọ tụrụ anya obodo nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke. Ya mere o ji biri dị ka onye ọbịa n'ụwa a.
Ebraham biri ndụ ya na-enweghị ihe ọbụla jikọrọ ya n'ihe onwunwe a na-ahugasi anya ndị o nwere.
Ebreham bụ ihe akaebe zuru ezu iji mee ka anyị ghọta na okwukwe kwesịrị ekwesị ga-eme onye kwere ekwe ka o lekwasị anya ya n’ihe ndị nwere uru ebighị ebi, ma meekwa ka anyị bụrụ ndị chegharịrị uche anyị n'otu ihe ahụ.
EKPERE: Onye nwe m, nyere m aka ka m ghọta ihe bụ ezi nzube nke okwukwe. Nyere m aka ka m lekwasị anya m n'ihe ndị nwere uru ebighị ebi.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche nke Oziọma ndị Hibru 11:6-11 Okwukwe bụ ntọala nke mmekọrịta anyị na Chineke. Onye ọ bụla nke chọrọ iso Chineke na-eje ije ma na-arụrụ Ya ọrụ, aghaghị ịmụta ịtụkwasị Ya obi.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d