Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwukwe na-amasị ChinekeIhe Atụ

Okwukwe na-amasị Chineke

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Noa bụ nwoke nke tọrọ Chineke ụtọ

Ihe Ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ: Ndị Hibru 11:7 Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.

Onye ọbụla edere ihe banyere ya n'Akwụkwọ Nsọ bụ́ onye ya na Chineke nwere mmekọrịta dị ịrịba ama mere otú ahụ site ịkwenyere okwu Chineke n'ụzọ zuru ezu.

Noa bụ nwoke dị otú ahụ, onye mere Chineke obi ụtọ site n'okwukwe.

Chineke dọrọ aka ná ntị banyere iju mmiri nke ga-ebibi ụwa, gwa Noa ka o wuo ụgbọ.

Tupu Chineke ekwe nkwa a, mmiri ezobeghị ruo ihe karịrị narị afọ anọ.

Ọkwa ọ na-atọ gi ọchị?

Ee, weregodị ya na Chineke na-agwa gị okwu banyere iju mmiri na-abịanụ n'ala nke na-ahụbeghị otu mmiri ozuzo ruo ọtụtụ afọ?

Okwukwe Noa bara uru ịṅa ntị.

N'agbanyeghị na ala ebe Noa bi ahụbeghị mmiri ozuzo ruo ọtụtụ afọ, n'ihi na Chineke kwuru okwu, Noa họọrọ ịtụkwasị Chineke obi n'agbanyeghị ọnọdụ nke ọ na-ahụ n’anya.

Noa mere ihe, ọbụna mgbe ígwé ojii ka dị larịị.

Noa anaghị echere ihe àmà anụ ahụ́ ọ bụla, O weere okwu ọnụ Chineke dị ka ihe àmà zuru ezu, ma mekwa ihe.

Ụdịrị okwukwe nke na-eme Chineke obi ụtọ, bụ okwukwe nke na-kwenyere okwu ọnụ Chineke karịa ọnọdụ ọbụla ndị a na-ahụgasị anya.

EKPERE: Ezi Nna, nyere m aka ka m kwenyere okwu ọnụ gị karịa ihe ọbụla

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwukwe na-amasị Chineke

Echiche nke Oziọma ndị Hibru 11:6-11 Okwukwe bụ ntọala nke mmekọrịta anyị na Chineke. Onye ọ bụla nke chọrọ iso Chineke na-eje ije ma na-arụrụ Ya ọrụ, aghaghị ịmụta ịtụkwasị Ya obi.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d