Okwukwe na-amasị ChinekeIhe Atụ
Abraham ihe atụ nke okwukwe nke Akwụkwọ Nsọ
Ihe Ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ: Ndị Hibru 11:8 Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.
Ihe ngosi nke okwukwe bụ Nrubeisi ma ọ bụ kpọọ ya ihe omume kwekọrịtara okwukwe anyi.
Okwukwe enweghị ihu, ebe nrube isi adịghị.
Okwukwe na-enweghi ihe omume nke kwekọrịtara ya bụ naanị nkwenye nke dị n'uche.
Nanị ihe na-enye okwukwe ụda olu na nghọta bụ ihe omume nke na-esote ya.
Dị ka anyi hụrụ na ndụ Ebraham, o rubere Chineke isi n'amaghị nkọwa ọbụla. Ọ pụtara n'okwukwe, ma tụkwasị Chineke obi. Taa, a na-ewere ya dị ka Nna nke Okwukwe.
EKPERE: Ka m tụkwasị Chineke obi ọbụna mgbe okporo ụzọ na ebe m na-aga edochaghị m anya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche nke Oziọma ndị Hibru 11:6-11 Okwukwe bụ ntọala nke mmekọrịta anyị na Chineke. Onye ọ bụla nke chọrọ iso Chineke na-eje ije ma na-arụrụ Ya ọrụ, aghaghị ịmụta ịtụkwasị Ya obi.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d