Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwukwe na-amasị ChinekeIhe Atụ

Okwukwe na-amasị Chineke

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ?

Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

Ntọala ihe ọbụla ewuru ewu ga-ekpebi ike nke ihe owuwu a. Ọ ga-ekpebikwa ụdị ihe mgbochi nke o nwere ike iguzogide ma merie nke ọma.

Okwukwe bụ ntọala nke mmekọrịta anyị na Chineke.

Okwukwe bụ ntọala nke njem anyị na Chineke.

Okwukwe bụ ntọala nke ọrụ anyị n'ime Chineke.

Onye ọbụla kwere ekwe, onye chọrọ ka ya na Chineke nwee mmekọrịta dị irè dị ka e kwuru n'okwu Chineke, aghaghị icheta mgbe niile otú e si mụọ mmekọrịta ahụ, Okwukwe.

Mmekọrịta a mụrụ site n'okwukwe ga-anọgide site naanị n'okwukwe.

Onye ọbụla kwere ekwe, onye chọrọ ime Chineke obi ụtọ, ga-eme ya naanị site n'inwe okwukwe n’ime Chineke, ma na-atụkwasịkwa obi n'okwu ya.

EKPERE: Ezi Nna, nyere m aka ịtụkwasị gi obi mgbe niile, nyere obi m aka ịkwenyere n'okwu gi oge niile.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwukwe na-amasị Chineke

Echiche nke Oziọma ndị Hibru 11:6-11 Okwukwe bụ ntọala nke mmekọrịta anyị na Chineke. Onye ọ bụla nke chọrọ iso Chineke na-eje ije ma na-arụrụ Ya ọrụ, aghaghị ịmụta ịtụkwasị Ya obi.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d