Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.Ihe Atụ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Mkpụrụ nke mmụọ

Okwu nke Chineke bụ mkpụrụ nke mmụọ nke na-ahụta dịka ihe owuwe ihe ubi nke ga-ezu a mmadụ n'alaeze Chineke. Ihe ima aka nke na-anyị a ndị mmadụ maka ọdịda nke mmadụ nke emechaara chọpụta ozịza ya site na mgbe a kụrụ okwu Chineke dịka ihe ọkụkụ n'afọ nwaanyị na-amaghị nwoke bụ Meri (Matui 1:18-20). N'ime ya ka ndụ dị mana ndụ bụkwa íhè nke mmadụ. Mmadụ bidoro cbigharịa n'ihe nke mkpụrụ nke mmụọ mgbe okwu e mere ahụ ọ bịa nọnyere anyị, dịka n'akwụkwọ Jọn 1:14a nke kọwara nke ọma.

Mgbe ọbụla Chineke chọrọ ịchịkọta ihe owuwe ihe ubi, ọ ga-akụ okwu Ya dịka mkpụrụ (Mark 4:2-14). Tupu mkpụrụ ọbụla epuo, ọ dị ọtụtụ ihe nke atụrụ anya. Nkea sokwa n'ihe dabere nke ọma na mkpụrụ nke mmụọ nke a kpọrọ okwu nke Chineke. Ọ bụrụ na okwu nke Chineke ga-amipụta mkpụrụ nke owuwe ihe ubi dịka e siri chọọ ya, anyị kwesịrị ịmata etu esi,

Nweta Okwu ahu: N'inweta okwu ahụ bụ ịtụkwasị Jizọs obi site n'okwukwe ma jidesie nkwa Chineke n'ihe niile. Okwu nke ndụ nke bụ Kraịst nọkwa na mmụọ anyị ya na n'ime obi anyị. Mgbe anyị gere ntị n'ihe a chọrọ n'okwu, anyị ga-enweta ya ma bụrụkwa ihe ga-apụta ihe n'ụzọ ọbụla nke ga-eweta mgbanwe dị mma. Ị ga-agba mbọ mụọ ka e si enyocha akwụkwọ Nsọ nke ga-eme ka ị chọpụta okwu nke ga-eme eleba anya n'ọnọdụ gị niile ma tụkwasị obi gị na Chineke maka ha.

Kwekwa n'okwu Chineke: Mgbe emechara nchọpụta gbasara ihe okwu Chineke kwuru banyere ọnọdụ gị, kwere n'okwu ya. Na-atụgharị uche n'okwu ya ahụ ruo mgbe ọ gbanwere echiche obi gị. N'akwụkwọ ndị Kọrịnt nke abụọ 10:15 kwuru sị, ebe anyị na-eweta ihe ma na-atụle n'obi, na ihe niile ọbụla dị elu nke eweliri elu imegide ọmụma Chineke, anyị na-adọta kwa ihe niile ọbụla a na-echepụta n'agba ị na ntị Kraịst. Okwu nke Chineke agaghị amịpụta ihe atụrụ anya n'ihe owuwe nke ubi na ndụ anyị ma ọ bụrụ na ihe anyị na-eche akwudosighi ike n'ọnụma nke okwu Chineke.

Kwupụta Okwu Chineke: N'ikpeazụ, tupu mkpụrụ nke mmụọ nke okwu Chineke amipụta mkpụrụ nke owuwe ihe ubi, anyị ga-agba mbọ kwupụta na-atụghi egwu ihe ọ bụ. Okwu nke Chineke bụ ụdịdị ume na ike ibibi ikike niile nke ajọ onye ahụ na ndụ anyị. Mgbe anyị kwupụtara okwu Chineke site n' okwukwe, ọ na adọrọ ike dị na ya. Mgbe anyị na-enwe otu ụdịdị mmụọ nke okwukwe, dịka e deworo n'akwụkwọ Nsọ si dị kwuru: ekwere m n'ihi ya, anyị kwenyekwara mere ọ bụkwa n'ihi ya ka anyị na-ekwu (2 Kọrịnt 4:13). Ọbụladị mgbe ihe anyị na-atụ anya ya apụtabeghị ihe, agbaala nkịtị n'ikwu okwu Chineke, gbaa mbọ na-ekwu okwu Chineke ruo mgbe ihe ahụ mịtara mkpụrụ a chọrọ maka owuwe ihe ubi. Okwu nke Chineke bawanyere n'ike n'obodo ndị Efesọs (Olundi ozi 19:20). Ọnọdụ niile adịghị mma na ndụ gị ga-abụ ihe pụrụ n'anya ma ọ bụrụ na anyị ga-ekwupụta okwu nke Chineke, gbaa mbọ na-ekwu okwu nke Chineke.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ekliziastis 8:4, 1Pita 1:23, Jọn 2:1-11

Ekpere: Nna mee ka okwu gị mịa mkpụrụ n'ime ndụ m n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

Ihe ọmụmụ a na ihe ndị ọzọ bụ ebumnobi ihe ga-eme ka a mara ikike nke Okwu Chineke, na mmepụta nnukwu ikike ọlụ ebube ndụ mmadụ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg