Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.Ihe Atụ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ụzọ dị iche iche esi ahụta Okwu Chineke

Okwu nke Chineke dị ọtụtụ ma dịkwa iche iche. Mgbe anyị zutere okwu nke Chineke, n'ime mmadụ dịka Jizọs Kraịst, anyị na-emekọrịta n'ụzọ dị iche iche okwu nke Chineke. Okwu nke Chineke dị omimi ka Chineke. Ewezụga okwu ya, Chineke enweghị ihe a ga-eji mata ya.

Ebumnuche ebighi ebi nke Chineke bụ ka omejupụta mmadụ n'ime onwe ya, biri n'ime anyị ya na ka ọ pụta íhè site n'anyị. Ya mere site n'imejupụta ebumobi a, anyị kwesịrị, izute Chineke n'okwu ya site ntụ dị iche iche e si ahụta Okwu Chineke. Ntụ dị iche iche e si ahụta Okwu Chineke gụnyere;

Ụzọ dị iche iche gbasara okike: Akwụkwọ Nsọ kwuru si n'akwụkwọ Jọn 1:3 Ekere ihe niile site n'aka ya, ekeghikwa otu ihe ọbụla nke ekworo ma ọ bụrụ na ọnọghị ya. Okwu nke Chineke nwere ikike nke okike. N'akwụkwọ Genesis 1: 2-3, ụwa wee bụrụ ihe tọgbọrọ n'efu na ihe tọgbọrọ na nkịtị, ọchị chịrị dịkwa n'elu ogbu mmiri... Chineke wee kwuo Okwu ya. Akwụkwọ Nsọ mere ka anyị mara na oyiyi Chineke. Ya mere anyị nwere ikike i were ike dị n'okwu nke Chineke wee kee ụdịdị ọnọdu anyị chọrọ. Ọmụmaatụ mmadụ nwere ike kwuo okwu Chineke n'ebe onye ahụ adịghị nọ, onye ahu enwere onwe ya.

Ụzọ dị iche iche gbasara ndozi ahụ: Mmadụ nwere ike ito n'amamihe na mejupụta site n'iri okwu Chineke dịka nri. 1 Pita 2:2 kwuru si: Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke na-agụsị unu ike nke ga eme ka unu wee were ya na-eto. Okwu Chineke nke bụ Jizọs Kraịst ka a kpọrọ achịcha nke ndụ. Anyị ga-eto n'ogo dị etu a mgbe anyị na-eri okwu Chineke dịka nri. Jizọs sịrị ọ bụghị so ná nri ka mmadụ ji adị ndụ kama ọ bụ okwu ọbụla siri n'ọnụ Chineke pụta Matiu 4:4.

Nsacha nke ụzọ dị iche iche esi ahụta okwu Chineke: Okwu nke Chineke nwere ikike eji asacha onye mmehie ma mee ka ọ dị ọcha. N'akwụkwọ Efesọs 5:6 kọwara nkeọma ihe bụ Nsacha nke ikike nke okwu Chineke. Ebumnuche Jizọs jiri nwụọ ọnwụ n'elu obe bụ ka ọ sachaa nzukọ ya site na Nsacha nke mmiri site n'okwu ya.

Chineke ebuliela okwu ya karịa ihe niile, nke ga-eme ka anyị zute ugbu nrite nke okwu ya site itinye oge anyị n'okwu Chineke.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Jọn 17:17, 2 Timoti 3:15-17, Luk 5:4-7

Ekpere: Nna nye amara nke ga-eme ka m na-agụ ma na-atụle okwu gị, site n'ụbọchị taa n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

Ihe ọmụmụ a na ihe ndị ọzọ bụ ebumnobi ihe ga-eme ka a mara ikike nke Okwu Chineke, na mmepụta nnukwu ikike ọlụ ebube ndụ mmadụ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg