Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.Ihe Atụ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Okwu nke Ndụ

Okwu Chineke bụ onye nnọchite anya nke ndụ. O nwere ihe niile nke na enye ndụ n'ọnọdụ nwugoro anwụ. Hebru 4.:12 kwuru sị "N'ihi na Okwu Chineke dị ndụ na-arụsịkwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọbụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n'ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma nkwọnkwọ ma ụmị, buru kwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu niile nke obi. Okwu nke Chineke na-emetụta mmadụ n'ụzọ ọbụla (mkpụrụobi, mmụọ na ahụ).

Mgbe njo/mmehie batara n'ime mmadụ, n'ogige nke Eden, o budara mmụọ nke mmadụ. Mmadụ na Chineke enwezighi ike ịnọkọrịta dịka ha si emebu mbụ. Mana okwu nke Chineke bụ ndụ weghachitere ndụ na mmụọ nke mmadụ azụ, ozigbo ahụ anyị nabatara okwu nke Chineke n'obi anyị. Anyị wee bụrụ ndị amụgharịrị ọhụrụ site n'okwu nke Chineke.

Ndụ bụ njem nke onye njedebe bụ nke dabere na ihe nhọrọ emere. Onye ọbụla nọ n'elu ụwa a bụ onye njem, ya mere, etu ọbụla mmadụ sịrị họrọ ime njem n'ụwaa gbadoro ukwu ebe onye ahụ ga-ebi ndụ ebighị ebi ya. Ndụ anaghị ebido ma ọ bụrụ na mmadụ ebughi ụzọ họrọ ma nabata ike nke KKraịs (1 Jọn 5:11-12).

Mgbe ị matara na ndụ na-ebido mgbe ị họọrọ inabata na iso ụzọ nke Kraịst mgbe ahụ ka ị ga-echekwaba nzọpụta gị site n'ịtụ egwu Chineke na site n'ịma jiji n'okwu ya. Na-ime ka ndụ dị ọbụkwa ndụ bụ íhè nke mmadụ (Jọn 1:4). Họrọ n'ụbọchị nke taa, ma kwụputa nke ndụ n'ihe niile bụ ihe nwụrụla anwụ na ndụ gị. Ya na ị nara Jizọs dịka onye nwe gi na ndụ gị.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Abụ Ọma 1:7-20, Hebru 3:7-9, Matiu 8:8

Ekpere: Nna, ka okwu gị tọọ ntọala n'obi m na n'ihe niile gbasara m.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

Ihe ọmụmụ a na ihe ndị ọzọ bụ ebumnobi ihe ga-eme ka a mara ikike nke Okwu Chineke, na mmepụta nnukwu ikike ọlụ ebube ndụ mmadụ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg