Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.Ihe Atụ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Okwu na-enye íhè

Mgbe ọbụla ndụ batara, ihe na-esochi ya azụ bụ íhè. Akwụkwọ Nsọ tinyere ya n'ụzọ dị otu a n'akwụkwọ Jọn 1:4 "N'ime ya ka ndụ dịrị, ndụ ahụ bụrụkwa íhè nke mmadụ. Mmadụ nke na-enweghị íhè ga-anọgide n'agbụ nke ọchịchịrị.

Ekwensu, nwa nwoke nke ọchịchịrị chọrọ ka ọ bụrụ onye ga na-achị isi n'ihe ọbụla gbasara mmadụ, ma merie ụwa. Ya mere site n'ihe ọjọọ a na-ahụ n'ụwa taa. Nwanne m hụrụ n'anya, okwu nke Chineke bụ íhè na-anaghị anyụ anyụ nke na-enweghi ike iwepu, menyụọ maọbụ merie. Ya mere íhè na-acha n'ọchịchị, ma ọchịchị ekpuchi gị ya (Jọn 1:5).

Ọ bụrụ na anyị ga na-eri okwu Chineke ka nri, ma rubere okwu ya isi n'ihe niile o dere n'ime akwụkwọ Nsọ, mgbe ahụ ka anyị ga-emeri ọrụ ọchịchịrị n'ime ndụ anyị na n'ebe ọbụla anyị bi. Mgbe Jizọs batara n'obodo Capaniọm na Matiu 4:13-16.

Enwere ihe ndekọ na ndị mmadụ ndị nọ n'ọchịchịrị nwetara/ hụrụ nnukwu íhè. Ejiri ikike rịọ mmadụ n'ụlọ nsọ ka ha gaa n'ime ụwa ma zisaa oziọma nke Chineke ka e were weghachite nsọtụ ndị furu efu n'obodo, n'ogbe, n'ebe niile, ya mere anyị ga-agarịrị n'ime ụwa niile ga gbasaa oziọma nke Chineke.

Ọ bụ site na-iri okwu Chineke dịka nri mgbe ọbụla na irubere Okwu Chineke isi bụ ihe ga-eme ka anyị bụrụ ụmụ nke íhè nke na-eweta nwere onwe na nnapụta nye ụmụ mmadụ. Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ogbụ nke mmehie, agwa ọjọọ dị iche iche dịka nwoke na nwoke inwe mmekọ, agbụ nke otu nzuzo dgz. Ike nke ọchịchịrị niile ndịa bụ n'ihe nzuzo ka amaara ha. Akwụkwọ Nsọ kwuru n'Efesọs 5:11-14 ọchịchịrị nke na-anaghị amịta mkpụrụ kama gbaa ha niile n'anwụ. Ya mere, ya kwuru sị, Teta gị onye na-arahụ ụra, sikwa na ndị nwụrụ anwụ bilie, Kraịst ga-anụkwasi gị íhè. Mmadụ ị gbanahụ ike ọchịchịrị niile, anyị ga-agba mbọ hapụ inwe mmekọ nke n'ọrụ niile

nke ọchịchịrị nke na-anaghị amịta mkpụrụ kama anyị ga-agba mbọ kpụghe ihe nzuzo ya niile. Site, n'ụdịdị ngwa ọgbaraọhụrụ dị n'ihu ugbua, anyị nwere iki izisa oziọma nke Chineke ma nye íhè n'ụwa a na-anwụ anwụ.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: 2 Timoti 4:1-2, Matiu 28:18-20, Jeremaya 15:16

Ekpere: Nna biko nyere m aka n'uju ka m soro ná ndị ga na-ekwusa oziọma nke Chineke anyị bụ Jizọs Kraịst.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

Ihe ọmụmụ a na ihe ndị ọzọ bụ ebumnobi ihe ga-eme ka a mara ikike nke Okwu Chineke, na mmepụta nnukwu ikike ọlụ ebube ndụ mmadụ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg