Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.Ihe Atụ

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Na Mbụ /Mbido

Ihe niile dị n'ụwa a nwere mbido. Nchịkọta nke ihe niile gbasara Okike ụwa na eluigwe gbadoro ụkwụ na mbụ, site na ndụga ndụ rụọ na ndụga ndụ. Ihe ọgụgụ dị iche iche e edere n'akwụkwọ Nsọ dịka Jọn 1:1 bidoro n'ịkọwa na mbụ ka okwu ahụ dịrị, okwu ahụ bụkwa Chineke.

Okwu a bụ nkọwapụta, nkọwa na igosi nke Chineke; gosịrị, ọ bụ Chineke akọwapụtara, kọwaa na gosipụta kwa. N'akwụkwọ Mkpughe 19:11 wepụtara ọnọdụ iji uche hụ ihe ọsọ ọsọ nke akpọrọ okwu nke Chineke nke bụkwa Kraịst. Nke a kwuru sị: E kpukwasiwo ya uwe nke efesaworo ọbara, a kpọwokwaa aha ya okwu Chineke.

Kraịst nke bụ Okwu Chineke, gbadoro ụkwụ na mbido, ya mere isi ihe anyị ka achọpụtara sọsọ na gburugburu nke Okwu Chineke. Agaghị ekewapu okwu Chineke n'ime Chineke. Anyị ga na-ege ntị n'okwu Chineke, n'ihe niile ma tụkwasị okwu ya obi nke ga na-agbaziri anyị ụzọ ndụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịtọ ntọala mmekọ rita gị na Chineke, ị ga-agba mbọ bụrụ onye maara okwu nke Chineke.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe na-gara gị nke ọma na ndụ, anyị ga-agba mbọ mmalite ihe niile nke anyị na-eme n'ụbọchị, ọrụaka anyị, alụmdi na nwunye, atụmatụ gị niile, ihe ndekọsị gị niile dgz, anyị ga-agba mbọ chọọ ma mara ihe okwu Chineke kwuru, nke sitere na mbụ/mbido.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Hibru 7:3, 1 Jọn 1:4, 1 Samuel. 3:2

Ekpere: Nna ekele m gị maka nkwa niile na ngọzi niile dị n'okwu gị. N'ụbọchị taa ana m enyefu ndụ m n'iso n'okwu gị n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iwepụta ihe atụrụ anya n'okwu nke Chineke.

Ihe ọmụmụ a na ihe ndị ọzọ bụ ebumnobi ihe ga-eme ka a mara ikike nke Okwu Chineke, na mmepụta nnukwu ikike ọlụ ebube ndụ mmadụ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg