Ịga Ijè n’Nzube ChinekeIhe Atụ

Iji Nkume Gị
Mgbe m bụ nwata, nna m zụtara ébé (kàtàpọt) maka ịchụ nta nnụnụ. Ọ baghị uru, ọ gwụla ma ị nwere nkà na ahụmịhe iji ya. Ahụrụ m ébé nna m n’anya, mana ọ dị nwute, enweghị m ike iji ya. Azụbeghị m onwe m ime otú ahụ.
Devid nwere ngwá ọrụ yiri nke ahụ, ọ maliteghị ịgba èbè na nkume n’ụbọchị o busoro Golayat agha. Ọ teela o ji were ya mebe ihe, na-anụcha nkà ya, na ịzụ onwe ya, ka o wee nwee ike ịgbachitere atụrụ nna ya.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na e nyere Devid uwe agha na okpu agha Sọl ma ọ jụrụ. Ha buru oke ibu, na-anyị oke arọ. Ha gaara eme ya ka ọ ghara ịdị irè megide Golayat. Ọ ghọtara na Chineke akwadola ya ka ọ were èbè ya, ọ nọgidekwara na nke ahụ.
Na mahadum, ọ na-amasị m ime fim oziọma. Achọsiri m akụrụngwa bụ ọkpọkọpị iji mee ka nrọ a bụrụ eziokwu ike. Agwara m nna m na m chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ ihe nkiri na New York. Ọ gwara m na ya enweghị ego maka nke ahụ. O chetaara m na ihe mere m ji na-achọ ime fim bụ iji gọzie ndị mmadụ, ọ bụghị igosi nkà m, ma dụọ m ọdụ ka m jiri ngwá ọrụ m ji n’aka zụọ onwe m. Naanị ihe m ji n’aka bụ ekwentị ochie. Arịọrọ m Chineke ka o zụọ m, wee mụta ngwa ngwa na Mụọ Nsọ bụ onye nkuzi kachasị ukwuu nke enweghị ike iche n’echiche. Amalitere m iji ekwentị mkpanaaka m ese obere ihe nkiri. Etinyere m ha na YouTube, ha gọzie ọtụtụ mmadụ. Akwụsịghị m ebe ahụ. Anọgidere m n’iji ngwá ọrụ ndị na-adịghị mma m na-eme ọtụtụ ihe nkiri ruo mgbe m mụtara nkà nke iji ha eme ihe.
Ụkpụrụ a pụtara na ndụ Devid. Ekpugheghị ya na mma agha ma ọ bụ ngwa agha. O ji èbè na nkume nke maara ya ahụ́, ndị na-abụghị ọkaibè, nke ọ mụtawokwara etú e si eji ha eme ihe.
Ọ dị mma ibido obere ka anyị na-eje ije na ebumnuche nke Chineke maka ndụ anyị. Chineke haziri usoro ito eto. Ọhịa nwere mgbe ọ bụ otu osisi. Otu osisi bụbu otu mkpụrụ. Ọtụtụ ndị na-arọ nrọ ịghọ oke ọhịa, ma ha achọghị ịmalite site na mkpụrụ. Ahụlà usoro ọzụzụ gị ka ọ gaa ọsọ ọsọ. Adịla ngwa ngwa iji mma agha mgbe Chineke ka na-azụ gị n’etu e si eji nkume. Devid ji amamihe jụ ihe agha na mma agha Sọl, kama họrọ nkume ise. Ọ ga-abụrịrị na ọ bụ ihe nzuzu n’anya ndị gbara ya gburugburu, ma ọ dị ka Devid ghọtara na ọ bụghị ohere niile maọbụ ọnụ ụzọ mepere emepe si n’aka Chineke. Devid ghọtakwara ụkpụrụ nke ito eto. Ọ maara na ọ bụghị oge maka mma agha - nke ahụ ga-abịa mgbe e mesịrị. Ọ họọrọ ihe dabara n’ọkwa nkwadebe ya: nkume.
Nkume Devid nwere ike ịbụ ngwá agha ndị na-enweghị isi, ma ihe ha rụpụtara dị ebube n’ihi na o ji ihe ndị dị n’aka ya mee ihe. Chineke na-akpọ gị ka i mee otu ihe ahụ.
Ihe Ọgụgụ: 1 Samuel 17:38-51; 1 Samuel 17:40.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/