Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịga Ijè n’Nzube ChinekeIhe Atụ

Ịga Ijè n’Nzube Chineke

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

Ichebe Nzube Gị

Ọ nweghị ka a gaghị esi ekwu na ekwensu achọghị ka ị na-eje ije n’uche Chineke. Ọ ga-eme ihe ọbụla iji mebie ọdịnihu gị. Ya mere, ọ dị mkpa ịmara etú ị ga-esi chebe nzube gị.

Devid si n’imeri Golaịat lọta baa n’ịja mma Israel niile – nke na iwe webere Sọl – si ụbọchị ahụ baa n’ihe ize ndụ na agha, nke ekworo Sọl kpalitere. Sọl kpebisiri ike ibibi nzube Devid. Nwa Sọl na ezigbo enyi Devid, bụ́ Jọnatan, dọrọ Devid aka ná ntị banyere nzube Sọl igbu ya, Devid wee gbaa ọsọ. Dị ka onye bu nzube Chineke, ị kwesịri ịgbanahụ ndị mmadụ na-achọ imebi maọbụ mebie ọdịnihu gị. Ọ bụghị onye ọbụla na-aghọta ebe Chineke si kpọpụta gị na ebe Ọ na-akpọga gị.

O nwedịrị ike ịgbaga n’ebe dị ka ọzara, etu Devid si mee, n’ihi na Chineke chọrọ ịzụ ma nụchaa gị site n’iwepụ gị n’ebe nkasi obi gị nọ ma mee ka i nwee ihe ịma aka ndị siri ike. Nke a abụghị iji mebie ebumnuche gị, kama iji mụọ ya. Ọlaedo na-agafe n’ọkụ tupu ezi ebube ya achakee. N’otu aka ahụ, tupu Chineke egosi gị ụwa, O nwere ike ikwe ka ị gafee n’ọkụ. Obi dị m ụtọ, O kwere nkwa na ya ga-anọnyere gị ma chebe gị mgbe ị gafere ma n’ọkụ ma n’idei mmiri.

Iji chebe nzube Chineke ná ndụ gị, nzọụkwụ mbụ bụ ịmụ na ịnọgide na-eme Okwu Chineke n’ezie. Dị ka ọ dịịrị Devid, Okwu Chineke bụ oriọna maka ụkwụ gị na ìhè maka okporo ụzọ gị. Kpebisie ike ka ị ghara ikwere àsị́ ekwensu. Ihe ụwa na-ekwu banyere gị adịghị akọwa onye ị bụ maọbụ ebe Chineke na-akpọga gị. Ụzọ kacha mma isi chebe ebumnobi gị bụ iji obi gị dum kwere ihe Nna gị nke eluigwe na-ekwu gbasara gị n’Okwu Ya (ọ bụghị ihe soshal midia na-ekwu gbasara gị).

Nke abụọ, muta nkà nke nraranye na nrube isi nye onye nkuzi. Ị chọrọ okwu agbamume nke ndị ji ntakịrị ihe wee kara gi na njem nke ndụ.

Nke atọ, dị njikere maka ọrụ. Ọ bụrụ na ị bụ oke mmadụ ije ozi, ya bụ na ị dị obere ibu onye ndu. Ndị ukwu niile bubu ndị ohu. Ọbụna Devid fere eze Izrel n’otu oge, mechaa ghọọ eze n’onwe ya. Ọ bụrụ na ị arọ nrọ ịbụ nnukwu onye na-agụ egwu, chọọ ngalaba egwu na ụlọ ụka dị n'ógbè gị wee malite ije ozi, ọbụlagodi n’ụzọ kacha nta.

Nke anọ, dị umeala n’obi. Chineke na-emegide ndị mpako ma na-awụsa amara ya n’ahụ ndị dị umeala n’obi. Mgbe anyị ji obi umeala tụkwasị Ya obi, Ọ na-ebuli anyị elu mgbe oge ruru.

Ka ìhè gị nwuo ruo nsọtụ ụwa ka ị na-eje ije n’ọṅụ n’ime nzube Chineke!

Ihe Ọgụgụ: 1 Samuel 16:21; 1 Samuel 18:6-9; 1 Samuel 19:1-2; 1 Samuel 23:14; Abụ Ọma 119:105; Aịzaya 43:2; 1 Pita 5:5-6.

Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ịga Ijè n’Nzube Chineke

Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/