Ịga Ijè n’Nzube ChinekeIhe Atụ
Nkwadobe na-ebute Ngosipụta
Dị ka nna, anaghị m ekwe ka nwa m nwanyị dị afọ abụọ na-eji ihe ndị dị ka mma n'ihi na ọ dịghị njikere ime etú ahụ. Achọrọ m idobe ya, ya bụ ọ ga-akara m mma ịhapụ ya ka o jiri ihe eji egwuregwu, wee na-egwuri egwu. Dị ka Nna anyị, Chineke na-echebe anyị pụọ n’ihe ndị anyị na-adịchaghị njikere ime. Anyị nwere ike ịrịọ Chineke arịrịọ maka ihe bara uru maọbụ nke bara uru anyị maara na Ọ nwere ike inye, mana Ọ nwere ike igbochi ya ruo mgbe anyị jikere nke ọma ịnata ngọzi Ya. Anyị nwere ike na-eso ọrụ ihe iriba ama mana Chineke na-elekarị anya na nkwadobe gị
Ụkpụrụ nke nkwadebe a pụtara ìhè na ndụ Devid. O meriri Goliath - nnukwu onye agha a na-enweghị mgbagha – n’ihi na ọ na-anwalebu nkà ya na ọdụm na anụ ọhịa bea mgbe ọ na-achịkwa atụrụ nna ya (mgbe ọ dịghị onye na-ekiri ya).
Anyị niile na-achọ igosipụta onyinye na nzube anyị ozugbo anyị nwere ike - mana ọ bara uru idị nkwadobe. Ọtụtụ mgbe, nkwadebe na-abụ na nzuzo ebe ọ nweghị onye na-ahụ gị maọbụ ihe ịgara gị nke ọma. Ma mgbe ọ dịghị onye ọzọ na-ahụ, Chineke na-ahụ ya. Ọ na-azụ aka gị maka agha. Ewela iwe mgbe ọ nweghị onye na-ekele gị maka nnukwu ọrụ ị na-arụ. Ya adịla gị ngwa ka ndị mmadụ hụ ya mgbe Chineke akwadọchabeghị ndụ gị.
Onyenwe anyị kwadoro Devid dị ka nwa okoro ọzụzụ atụrụ na-elekọta atụrụ nna ya. N’ihi ya, Chineke gụrụ ya ka onye ruru eru ilekọta atụrụ Izrel. Ọ kwesịrị nkụkwasị obi n’obere ihe. Ọ dị njikere ikwesị ntụkwasị obi na nnukwu ihe.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-apụ na ihe nwere ike ịbụ ikpo oku maka ngosipụta na ọganihu ha, n'ihi na anya ha lekwasịrị na nnukwu ohere maọbụ ihe nnweta, ya mere, ha na-eleghara obere ọrụ ndị nwere ike imeghe ọnụ ụzọ dị ịrịba ama. Obere ọrụ ndị ahụ bụ nkwadebe nke ga-agbakọta na nzube gị nke ga-egosipụta ka ụwa hurụ. A sị na Devid ledara atụrụ nna ya anya ma leghara ha anya, ọ garaghị enwe akụkọ ọ ga-enye Sọl mgbe ohere ahụ bịara n’ihi na ọ bụ n’ihi agamniihu na ikwesị ntụkwasị obi ya n’obere ọrụ ka Sọl ji gụnye ya ka onye ruru eru iwere nnukwu ọrụ.
Enwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji agbara ọrụ dị iche iche ọsọ, karịsịa n'ime ụlọ Chineke. Ụfọdụ na-eche na a gaghị ahụ ha; ụfọdụ na-eche na ọ bụ igbu oge; ebe ụfọdụ na-eche na ije ozi n’ọgbakọ anaghị enye nnukwu ego. Ihe ha na-amaghị bụ na mgbe ị na-enye ihe gị niile mgbe ọ dịghị onye na-ahụ gị maọbụ na-akwụghachi gị ụgwọ, ị na-edozi usoro maka ngosipụta gị n’ọdịnihu.
Ya bụ, na-arụsi ọrụ ike na ebe nzuzo. Adịla achụ ka i wuo ewu, ego maọbụ ka amata gị. Na-achụso uru na nzube. Ejerela Chineke ozi n’ihi ihe ị chọrọ ịnara ya, kama jeere ya ozi n’ihi na ị chọrọ inye ya ihe gị niile. Chineke nke na-ahụ ihe ị na-eme na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.
Ihe Ọgụgụ: 1 Samuel 17:32-37; Luk 16:10.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/