Ịga Ijè n’Nzube ChinekeIhe Atụ
Gịnị bụ Nzùbe?
Enwere ike ịkọwa nzube dị ka ọrụ Chineke zitere gị ka ị rụzuo, maọbụ nsogbu dị n’ụwa ezitere gị ka I dozie. Ị bụ ọrụ aka Chineke, nke e kere n’ime Kraịst Jizọs ịrụ ezi ọrụ, nke Chineke kwadebere n’ihu gị ka ị rụọ.
N’ezie, ọ bụrụ na ịchọrọ ịghọta nzube nke ngwaahịa ọbụla, jụọ onye mepụtara ya. Ọ bụ ya mere ndị na-emepụta ihe ji akwadebe akwụkwọ ntuziaka na-akọwa ọrụ ha mepụtara. Chineke bụ onye nrụpụta na onye mmepụta anyị, akwụkwọ ntuziaka Ya maka ndụ anyị bụ Okwu Ya. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ele anya ebe niile ma e wezụga Onye Okike anyị, iji ghọta nzube anyị.
Ya mere, nzọụkwụ mbụ n’ịchọpụta nzube bụ imelite mmekọrịta gị na Chineke site na Jizọs Kraịst na ịbanye n’ime Okwu Ya. Ịmụ ndụ ndị ọzọ na soshal midiyaa agaghị eduga gị nso na oku Chineke na ndụ gị. Ị ga-achọta ụzọ gị n’ime nzube, naanị mgbe Okwu Chineke ga-aghọ akwụkwọ nduzi gị.
Ọ dịkwa mkpa ịrịba ama na nzube ihe anaghị abịa ka emepụtasịri ya, kama tupu emepụta ya. Nke ahụ pụtara, na Chineke bu nzube gị n’obi tupu o kee gị. Ọ na-asị Jeremaya, ‘Tupu m akpụọ gị n’afọ, amaara m gị; tutu a mụọ gị ka m kewapụrụ gị; M họpụtara gị dị ka onye amụma nke mba dị iche iche.’ Mgbe ndụ na-eji gị egwuri egwu, ọ bụ ihe na-agba ume icheta na tupu a mụọ gị, Chineke maara gị, na Ọ haziworị nzube gị.
Isi ihe ekwensu bu n’obi bụ izuru ebumnuche ahụ. Ọ ga-eji adịghị ike gị na ida mbà gị mee ka ị chee na ị rughị eru imezu akalaka gị. Mgbe mwakpo ndị ahụ bịara, kwupụta eziokwu nke Okwu Chineke. Onye ka Chineke kwuru na ị bụ? Ekwela ka onye ọbụla gwa gị ihe ozo.
Jeremaya lere ihe ndị mere na ndụ ya anya ma wepụtasịa ihe mere ọ gaghị eji ejere Chineke ozi. Ọ bụghị ezigbo ọkà okwu. O tozughị oke. Chineke gọnarị ihe ngọpụ ndị ahụ site n’igwa ya eziokwu, na Ọ ga-akwadebe ma nyekwa Jeremaya ike
Anọ m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị mgbe m malitere ịbanye na ọkpụkpọ oku m. Agbalịrị m n’agụmakwụkwọ ma ọtụtụ ndị nkuzi gwara m na agaghị m enwe agamnihu na ndụ m. Mana n’etiti ihere na ihe mgbu ahụ, Chineke gwara m ka m bilie mezuo ebumnuche O ji kee m. Ndị mmadụ na-akpọ m onye dara ada, ma Chineke mere ka o doo anya na ekwesịghị m ịkpọ onwe m ihe ọ na-akpọghị m.
Ya bụ, kedu ihe ngọpụ gị? Chineke nwere ike iji gị wulite Alaeze ya n’ebe ọbụla, n’agbanyeghị afọ ole Ị dị gị, maọbụ ogo ndụ gị. Ekwela ka àsị́ ekwensu dọpụ uche gị. Eledala onwe gị anya. Amàchìlà ònwe gị. Ma n'ezie, amachila Chineke. Agwala onwe gị na i rubeghị afọ nke kwesịrị ekwesị ka Chineke jiri gị mee ihe. Ọ bụrụ na Ị chọputa nzube Chineke maka ndụ gị na gboo, ọ ga-aka mma. Mara taa na ụbọchị niile na Chineke anaghị akpọ ndị tozuru oke. Ọ na-eme ka onye a kpọrọ tozuo.
Ihe Ọgụgụ: Jeremaya 1:5 -10; Ndị Efesọs 2:10 .
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/