Ịga Ijè n’Nzube ChinekeIhe Atụ
Nzube Onye?
Mgbe m bụ nwa okorobịa, enwere m nrọ ịbụ onye na-ese sinima kacha mma n’ala m. M na-agụ akwụkwọ mgbe niile ma na-ekiri nkuzi ndị mere ka ọchịchọ m siwanye ike. Ma ka mmekọrịta mụ na Chineke na-adịwanye omimi, achọpụtara m na echiche efu m enweghị ezigbo ihe ọgbadoro ụkwụ na ya, ọ nwekwaghị ihe na-adọkpụ ya, n’ihi na ọ bụ naanị maka onwe m ka m na-eche kemgbe. O nweghị mgbe ọ bụ banyere Jizọs. Naanị mgbe m nyefere ya nrọ m ka m nwetara ezi mmezu. N’agbanyeghị etú ihe i na-achosi ike si maka mma, ọ bụrụ na Jizọs anọghị n’etiti ya, n'ikpeazụ ọ gaghị eme I nwee afọ ju gị.
Enwere nnukwu ihe dị iche dị n'etiti ọhụ̀ na ọchịchọ. Ọhụ̀ bụ echiche nke ọdịnihu mmadụ sitere n'ike Mmụọ Nsọ Chineke. Ọ bụ atụmatụ Chineke nwere maka ndụ gị. Ọchịchọ bụ echiche ị nwere maka ọdịnihu. Ọ bụ ihe ị na-akwado ịbụ. Ọ bụ ihe niile gbasara gị. Chineke bụ isi iyi nke ọhụ̀, ma o bụ na gi ka ọchịchọ gi si aputạ. Oge na mmezu nke oke ọchịchọ gị bụ nke gi iji kpebie ma tụọ ya, mana oge na mmezu nke ọhụ̀ gị na ebumnuche gị bụ nke Chineke kpebiri. Ihe kacha mma ị nwere ike ịtụ anya ya mgbe ị mezuru ebumnuche gị bụ afọ ojuju onwe gị, mana imezu ọhụ̀ na-eweta mmezu nye gị na ndị mmadụ nọ gi n’akụkụ bu ndị na-enweta ihe n’aka gị.
Ndị oké ọchịchọ na-akwali nwere igbu ndị ọzọ iji nweta ihe ha na-achụ, ọbụna ibibi mba niile, etú Hitler si mee. N’aka nke ọzọ, ọhụ̀ na-enye ndụ. Solomọn dere na ọ ebe ọhu na-adighi ndị mmadụ na-ala n'iyi. George Muller, bụ́ onye ozi ala ọzọ na England na senchuri nke iri na itoolu, bụ ezigbo ihe atụ nke onye ji ọhụ sitere n’aka Chineke biri ndụ. Ọ rọrọ nrọ iwetara ụmụaka na-enweghị nne na nna ọṅụ. Ọ hapụrụ ihe niile o nwere iji malite ebe obibi ụmụ mgbei, na-atụkwasị Chineke iweta ihe niile. Ebumnuche ya bụ maka otuto nke Chineke na ọdịmma nke ndị ọzọ, ọ bụghị maka ọdịmma nke onwe ya.
Laghachi n’akụkọ Devid: mgbe Samuel tere ya mmanụ dị ka eze, ọ bụ nkwupụta nke nzube Chineke maka ndụ Devid. Otú ọ dị, mmezu nke nzube Devid emeghị ruo afọ iri na ise ọzọ. N’afọ ndị ahụ ọ nọ na-eche, Devid chere Golayat ihu, Sọl chụpụrụ ya n’ala, o zoo n’ọzara, na-agba ọsọ ndụ, na-alụkwa ọtụtụ agha. Iji lanarị ihe ahụ nile, ọ lekwasịrị anya n’ọhụ ahụ̀. A nwara ma nwalee ya ka Chineke mere ka o si n’ịbụ nwa okoro na-azuatụrụ ghọọ eze.
Mgbe ị na-eje ije na nzube Chineke, mgbe ụfọdụ ị nwere ike ị gaghị ahụ ihe jikọro ọnọdụ gị ugbu a na nkwa Chineke. Chineke elegharaghị gị anya. Nkwa ya maka ndụ gị adabeghị. Ọ dị ka Ọ na-arụ ọrụ n’ime gị, iji gbanwee gị site n’ịbụ nwa okorobịa na-azụ atụrụ bụrụ eze.
Olee nkwa Chineke kwere gị? Gịnị bụ nzube gị? N'agbanyeghị ihe ị na-agafe, na-echetara onwe gị kwa ụbọchị maka ọhụụ Chineke nyere gị maka ọdịnihu gị. Nzube ya maka ndụ gị ga-emezu.
Ihe Ogugu: 1 Samuel 16:12-13; Ilu 29:18 .
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/