Akwukwo Akuko Nso Maka Umu NtakiriIhe Atụ
Nwanyi a wee kwuru na akuku ugwu, were iwe di ya n'anya n'ele ihe nwute a ka nwa ya nwoke ji wee na anwu. Onye nne a bu Mary, wee kwuru na-akuku obe ebe a kpogburu Jisos n'obe.
Kedu ka ihe ndi a nile jiri mee? Kedu ka Jisos ga esi bichaa omaricha ndu Ya n'udi di uzo ojoor di otu a? Kedu ka Chineke siri wee hapu ka akpogbuo nwa Ya nwoke n'elu obe? Jisos o me joro n'igosi onye o bu? Chineke o haripuru?
Mba! Chineke aharipughi. O dighi nmejo Jisos mejoro. Jisos mara mgbe nile na ndi mmadu ojoor ga egbu Ya. Site na mgbe Jisos ka bu nwata, otu nwoke onye ozi Chineke aha ya bu simeon gwara Mary na ihe nwute di n'ihu.
Mkpuru ubochi ole tupu e gbuo Jisos, otu nwaagboho biara nwusa mmanu nwere isi oma n'ukwu Jisos. “Nwaagboho na atufu ego” ndi umu azu Jisos kwuru. “O ruru ezigbo oru”, Jisos kwuru. “O mere ihe a maka olili m”. Kedu udi okwu mgbagoju anya di ihe a!
Ka nke a gachara, Judas, otu onye n'ime umuazu Jisos kwetere iresi ndi isi nchuaja Jisos n'onu ego ola ocha iri ato.
N'emume ndi Jew bu passover, Jisos na ndi umuazu ya riri oriri ikpeazu. O gwara ha oru ebube na nkwa oma nile Chineke kwere ndi huru Ya n'anya. Mgbe ahu Jisos nyere ha achicha na iko mmanya ka ha kee onwe ha. Ihe ndi a onyere ha bu ka o chetara ha na O nyere ahu na obara Ya maka mgbahara nmehie anyi.
Mgbe ahu Jisos gwara umuazu/ndi enyi Ya mmadu ga eresi ya na aka ndi iro, ha bu umuazu ya ga agbahapu ya. “A gaghi m agbahapu gi” pita kwusie ike. “Tupu okuko akwa, i (pita) ga agonaghi m”, Jisos kwuru.
Ka emechara n'abali ahu, Jisos gara ebe a na akpo Gethsemane. Ndi umuazu ya so ya wee baa n'ura. Jisos wee kpee ekpere si, “Ka ewezugara m iko nke onwu a. Mana o bughi na nmasi nke m mana na nmasi nke Nna m bu Chineke.”
Ndi agha batakwutere ha n'ime ogige gethsemane na-atughi anya, Judas bu onye dutara ndi agha n'ogige a Jisos noo. Jisos akwusighi ha ime ihe ha kwere bia. Mana pita jiri nma chapu onye n'ime ndi agha ahu. Jisos jiri nwayo were metu nwoke ahu pita chapuru nti ma gwoo kwa ya. Jisos mara na njichi a ndi agha jichiri Ya so kwa na mmasi na echiche Chineke.
Ndi agha kpuoro Jisos kpuga Ya n'ulo otu onye isi nchuaja. Ebe ahu ka ndi isi ndi Jew kpebiri na Jisos ga anwu. Peter wee kwuru n'ebe adighi anya na akuku/agiga oku ndi odibo wee n'ele ihe n'eme nu. “Ndi mmadu lere pita anya ugboro ato wee si ya i bu otu n'ime umuazu Jisos!” pita gonaghiri ajuju a ugboro ato, di ka Jisos siri kwuo. Pita nyuruchara ma iyi.
Oge ahu ka okuko wee kwaa. Akwa okuko a kwara wee di pita ka olu Chineke na echetere ya ihe Jisos gwara ya. Pita bere akwa nwute mgbe o chetere okwu a Jisos gwara.
Judas ya onwe ya nwekwara nwute, O mara na odighi nmehie o bula Jisos mehiere. Judas weghachiri ego iri ato ahu o natara wee resi Jisos n'aka ndi iro ya, mana ndi isi nchuaja ahu a nataghi ya. Judas tufuru ego ahu n'ala, puo wee ga kwuo udo kwugbuo onwe ya.
Ndi isi nchuaja kpupuru Jisos n'ihu pilate onye ochichi ndi Rome. Pilate kwuru si, “Odighi ihe ojoor o bula m huru n'okwu gbasara nwoke a.” Mana ndi mmadu tiwere, “Kpogbue Ya! Kpogbue Ya!”
N'ikpeazu pilate mechara kwenye n'ihe ndi mmadu a n'ekwu, pilate wee maa Jisos ikpe onwu n'elu obe. Ndi agha suru Jisos okpo, buo Ya aso n'ihu ma piakwa Ya utali/apipia. Ha mekwara Ya okpu ogwu kpuwe Ya n'isi. Wee were ntu kpogbue Ya n'obe ka O nwuo.
Jisos mara mgbe nile na O ga anwu otu ahu. O makwara na onwu Ya ga ewete mgbahara nmehie ndi nmehie tukwasiri ya obi. A kpogburu Jisos n'etiti ndi ohi abuo. Otu n'ime ndi ohi abuo a kwenyere ma nyekwa ndu ya na Jisos, o ketere alaeze Chineke. Mana onye ohi nko ozo emeghi otu a.
Ka otu oge ha tachara Jisos ahuhu gachara, Jisos kwuru si, “O gwusi wo/O gwuchala,” O wee nwuo. O ruzuola ihe O kwere maka ya bia. Ndi enyi Ya gara lie ya n'ili otu nwoke gwuru onwe ya maka mgbe o ga anwu.
Ndi agha ndi Rome gbara ili Jisos gburugburu ka mmadu obulan hara inwe ike ibata ma obu puo kwa.
O gara abu ihe nwute ma oburu na ihe/akuko gbasara Jisos siri otu a bie. Mana Chineke ruru oru di ebube. Jisos anogideghi n'ime ala mmuo/ili!
N'uzo ututu/chi obubo ubochi nke mbu n'izu, ufodu umuazu Jisos biara hu ka e bupuru okwute ejiri wee mechie onu ili Jisos. Ha lebara anya n'ime onu ili Jisos ma ha ahukwaghi Jisos.
Otu nwanyi noro ebe ahu n'ebe akwa. Jisos biakwutere nwanyi ahu! O wee were oso na obi anuri gbahachi azu wee koro ndi umu azu Jisos. “Jisos di ndu! Jisos esi la n'onwu belie!”
N'oge na adighi anya Jisos bia gosi umuazu Ya onwe ya, O gosikwara ha ebe akporo ya ntu n'aka. N'ezie, Jisos ebiliwo n'onwu! O gbahara pita maka ngonaghi ahu pita gonahuru Ya, ma gwakwa ndi umuazu ya ka ha koro ndi mmadu maka Ya na mbilite n'onwu Ya. O wee lahachi alaeze eligwe ebe O siri bia.
Ngwucha
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kedu ka o si malite? Ebee ka anyị si bịa? Gini mere nhụjuanya di n 'uwa? Enwere olileanya ọ bụla? Enwere ndụ mgbe a nwụsịrị? Chọta azịza gị ka ị na-agụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Bible for Children, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bibleforchildren.org/languages/igbo/stories.php