Akwukwo Akuko Nso Maka Umu NtakiriIhe Atụ
Chineke kere ihe nile! Mgbe Chineke kere mmadu mbu nke bu Adam, ya na nwanyi ya bu Eve wee biri n'ime ala okuku ihe oma nke bu Eden. Ha nwere nnukwu onu n'iruwere Chineke isi na kwa nnokorita ha Chineke rue otu ubochi ...
“Chineke o gwara unu erikwala mkpuruosisi ndi a nile?” Ekwensu n'udi agwo juru Eve. Eve zara si, “Anyi nwere ike iri mkpuruosisi ndi a nani otu ka anyi a gaghi eri.” “Ubochi anyi riri ya, anyi ga anwu. Anyi rie ma obu metu mkpuruosisi a aka anyi ga anwu.” “Unu agaghi anwu”, ekwensu n'udi agwo aghogbuo Eve. “I ga agbanwe bia di n'udi oyiyi Chineke”. Eve wee choo mkpuruosisi ahu. O gere ekwensu nti wee rie mkpuruosisi ahu.
Ka oge Eve mmehie chara Chineke, o mere kwara ka Adam rie mkpuruosisi ahu. Adam gara asi, “Mba! A gaghi m emehie okwu Chineke”.
Mgbe Adam na Eve mmehiere Chineke, ha mara na ha gba oto. Ha mekotara ahihia were kpuchie ahu oto ga kwa zoo fue onwe ha n'ihu chineke n'ime ohia.
N'oge chi ojiji, Chineke biara n'agahari ka ha nwee mkparita uka. Chineke a marala ihe Adam na Eve mere. Adam bufere ya n'obu nwanyi ya kpatara ha jiri wee mehie Chineke, Eve wee si n'obu agwo nke bu ekwensu kpatara ihe a. Chineke wee buo agwo onu. Buo kwa nwanyi onu si, “Nwanyi ga na enwe nnukwu ihe ufu mgbe oga amu nwa”. “Adam maka mmehie gi, a buola m ala onu. I ga ata ahuhu nke ukwu tupu gi enwete ihe oriri gi ubochi nile”.
Chineke chupuru Adam na Eve n'ime omaricha ala okuku ihe. Maka mmehie ha, e wepuru ha nnokorita ha Chineke n'enye ndu!
Chineke wee dowe nma agha nke na egbu amuma i jiri gbochie Adam na Eve. Chineke mere ihe mkpuchi ahu oto nke o ji anu ahu umu anumanu. Kedu ebe Chineke siri nweta ihe ndi a?
Oge na adighi anya, Adam na Eve bia nwee ezinulo. Aha nwa ha nke mbu bu Cain, onye akukumaku ihe oriri na-kwa onye nlekota ihe okuku, nwa ha nke abuo bu Abel, onye ozuzu na nlokota aturu. Otu ubochi Cain wetara Chineke ufodu akwukwo nri dika ihe onyinye. Abel wetara Chineke nwa anumanu kacha umu anumanu nile o na-azu dika ihe onyiye. Chineke nwere nnukwu obi uto ebe Abel noo na kwa ihe onyiye ya, O wee nata ihe onyinye ya ma goziekwa ya.
Obi adighi Chineke nma ebe Cain na ihe onyinye ya noo. Cain were iwe nke ukwu u. Mana Chineke gwara ya si, “O buru na imere ihe kwesiri ka imee, o bu m agaghi anabata ihe onyinye gi?”
Cain ka bukwa iwe ahu n'obi. Otu ubochi, mgbe ufodu oge gachara Cain lusoro nwanne ya nwoke bu Abel ogu ma gbuo ya n'ebe ha na aru oru.
Chineke juru Cain si ya, “Kedu ebe nwanne gi nwoke Abel no?” Cain gwara Chineke okwu ugha si, “Amaghi m! Abu m onye nche nwannem?” Chineke tara Cain ahuhu site na i napu ya ikike o jiri aku oru ubi ma mee kwa ya ka o na agahari na enweghi onodu.
Cain wee puo n'ihu Chineke. Cain luru nwanyi bu otu nwa nwanyi Adam na Eve. Ha abuo wee mubaa ezinulo. Mgbe na adighi anya, umu umu Cain na kwa umu umu umu Cain bara uba n'obodo Cain hutara.
Otu ntabi anya ahu, ezinulo Adam na Eve bara uba nke ukwuu. N'oge ahu ndi mmadu na ebi otutu afo n'elu uwa tupu ha anwuo karia oge mgbu a.
Oge Eve muru Seth, Eve wee kwuo si, “Chineke enyehachila m nwa nkasi obi ga anochite anya Abel”. Seth bu nwa na atu egwu chineke o biri afo nari itolu na iri na abuo n'elu uwa ma muo kwa otutu umu.
N'elu uwa ndi mmadu biara di njoo nke ukwu u dika ka agburu di iche iche na agafe. N'ikpeazu, Chineke wee kpebie n'ime onwe ya imebi elu uwa na kwa umu anumanu na anu ufe nile. Chineke nwere nwute na o kere mmadu. Mana o nwere otu nwoke ndu ya masiri Chineke ...
Nwoke a bu Noah. O si na-agburu Seth, Noah bu onye ndu eziokwu ma kwuwa aka ya oto. O na eso nzokwu ma o bu uzo Chineke. O kuzie kwara umu ato ka n'eruwere Chineke isi. Chineke wee kpebie ka o were Noah kwara ngwooru puru iche di omimi n'uzo di iche.
Ngwucha
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kedu ka o si malite? Ebee ka anyị si bịa? Gini mere nhụjuanya di n 'uwa? Enwere olileanya ọ bụla? Enwere ndụ mgbe a nwụsịrị? Chọta azịza gị ka ị na-agụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Bible for Children, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bibleforchildren.org/languages/igbo/stories.php