Akwukwo Akuko Nso Maka Umu NtakiriIhe Atụ
Noah bu nani nwoke na-atu egwu Chineke. Mmadu o bula ndi ozo ahughi Chineke na-anya ma nupukwara Chineke isi. Otu ubochi Chineke kwuru ihe turu mmadu egwu, “A ga m emebi uwa ojoor a”, Chineke gwara Noah. “Nani ezinulo gi ka m ga ahapu”.
Chineke doro Noah aka na nti si ya a ga enwe nnukwu mmiri ozizo nke ga eju uwa nile. “Ruo nnukwu ugbo mmiri nke ga aba ezinulo gi na kwa umu anumanu gi nile,” A gwara Noah. Chineke nyere Noah ezigbo ntuzi aka. Noah wee banye oru!
Ndi mmadu chiri Noah ochi ma kwaa ya emu dika O na-akowara ha ihe o jiri na-aru ugbo ahu. Mana Noah kachiri obi na-aru kwa ugbo ahu. O gwara ha maka aka na nti Chineke doro ha na kwa ihe Chineke bu n'obi imebi uwa. Ndi mmadu a egeghi ya nti.
Noah nwere nnukwu okwukwe ma tukwasi Chineke obi rue ma mgbe mmiri ozizo ahu ezobeghi. Mgbe na adighi anya, o ruchara ugbo mmiri ahu fozie i kpobatazi ihe nile o nwere n'ime ugbo a.
Oge umu anumanu ahu abiala. Chineke wetere umu anumanu di iche iche asaa, abuo ndi ozo dikwa iche. Anu ufe nile ndi nnukwu na obere, anu ala ogologo na obere ihe ndi a banye chara n'ime ugbo mmiri a.
Ndi mmadu a kpariri Noah dika o na edu banye umu anumanu ndi a. Ha akwusighi i mehie Chineke. Ha ajughi kwa ma ha o ga a banyekwa n'ugbo mmiri ahu.
N'ikpeazu, umu anumanu ndi a na anu ufe ndi a were banye chaa n'ime ugbo ahu. “Bata n'ime ugbo a”. Chineke gwara Noah. “Gi na ezinulo gi”. Noah, nwanyi/nwunye ya, umu ya ndi nwoke ato na kwa ndi nwunye/nwanyi ha banye chara n'ime. Mgbe ahu Chineke wee mechie onu uzo ugbo mmiri a.
Ka nke a gachara, nnukwu mmiri ozizo wee mbido. Nnukwu mmiri ozizo a ndi ukwu u nke nochiri elu ala nile ruo ubochi iri ano.
Mmiri odido gazuru mba nile na kwa obodo nile. Oge mmiri ozizo a kwusiri, O riri elu ugwu nile. Ihe nile na eku ume ndu nwu chara.
Di ka mmiri ozizu bawanyere, ugbo mmiri ahu bia se n'elu mmiri. O nwere ike gbaa ochichiri n'ime ma na atukwa egwu. Mana ugbo mmiri a kpuchitere Noah n'ime mmiri.
Mgbe onwa ise gachara, Chineke zitere ikuku. Nwa mgbe nta/nwa obere oge, ugbo mmiri a biara kwusi ma zuokwa ike elu ugwu nke aha ya bu ugwu Ararat. Noah nokwara ubochi iri ano ozo n'ime ugbo tupu odo mmiri ahu ebelata.
Noah wee site na otu onu ikuku si abata zipu umu nnunnu abuo aha ha bu raven na dovu. Umu nnunnu a ahughi elu ala kporo nku di ocha ha nwere ike puta bia zuo ike. Nnunnu nke aha ya bu dovu mechara laghachite azu ebe Noah no mgbe ohuru na elu ala a kpochabeghi nku.
Ka otu izu gachara, Noah zipukwara nnunnu ahu bu dovu ozo. Nnunnu a bu dove wetere akwukwo ahihia bu olive di ohuru nke o kpu n'onu ya mgbe o laghachitere azu ebe Noah no. N'izu na abiabia/di n'ihu Noah mara na elu ala a kpochala nku ya mere nnunnu ahu bu dovu a laghachiteghi azu ozo.
Chineke gwara Noah oge e ruola mgbe i ga esi n'ime ugbo mmiri a puta. Noah na ezinulo ya otu oge ahu kpoputachara umu anumanu nile ha n'ime ugbo mmiri ahu.
Onye nwere ike ikowali udi obi uto na ekele Noah nwere! Noah wuru ebe ekpere ma kpere Chineke zoputara ya na ezinulo ya n'udi ajo odo mmiri ozizo ahu.
Chineke kwere Noah ezigbo nkwa puru iche. Si ya, a gaghikwa m e ji mmiri ozizo were kwuo mmadu ugwo mmehie ha ozo. Chineke were nye ihe ncheta nkwa a o kwere Noah. Chineke nwere rainbow dika ihe iriba ama nkwa a o kwere Noah.
Noah na ezinulo bidokwara ndu ohuru ozo mgbe nnukwu mmiri na odo mmiri ozizo gachara. Dika oge na-aga, agburu Noah mubanyere were ju elu uwa ozo. Mba/obodo nile no n'uwa sitere na agburu Noah na umu ya.
Ngwucha
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kedu ka o si malite? Ebee ka anyị si bịa? Gini mere nhụjuanya di n 'uwa? Enwere olileanya ọ bụla? Enwere ndụ mgbe a nwụsịrị? Chọta azịza gị ka ị na-agụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Bible for Children, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bibleforchildren.org/languages/igbo/stories.php