Akwukwo Akuko Nso Maka Umu NtakiriIhe Atụ
Onye kere anyi? Akwukwo nso, okwu nso Chineke gwara anyi otu mmadu jiri bido/puta. Mgbe/oge gara aga, Chineke kere mmadu mbu were nye ya aha a Adam. Chineke keputara Adam na aja ala. Mgbe Chineke kunyere ume Ya n'ime Adam, o buru mmadu di ndu. O huru onwe ya n'ime ebe okuku ihe nke aha ya bu Eden.
Tupu Chineke e kee Adam, O kere uwa nile ma chokwa ya nma nke ukwu u. Otu nzo ukwu ahu, Chineke kere elu ugwu, eluigwe, akwukwo osisi nwere isi oma na ogologo ukwu osisi, umu anu ufe nile nwere nku na ndi na-eme nkpotu ma ha n'efe hari, umu nnukwu azu nmiri na ndi nke na ari ari. N'ezie Chineke kere ihe nile e kere eke.
N' oge/mgbe mbu, tupu Chineke e kee ihe obula, nani Chineke di. Mmadu obula, obodo obula na ihe obula adighi. O dighi ihe di nu. Ihe adighi, Ochichiri adighi. Elu na ala adighi. Echi gara aga adighi, echi na-abia bia adighi. Nani Chineke onye na-enweghi mbido. Chineke wee bido ke we ihe nile.
N'isi mbido uwa, Chineke kere eluigwe n'uwa.
Elu uwa sara mbara nke ukwu u o dighi kota onu. Ochichiri gbara ebe nile nke di omimi. Mgbe ahu Chineke nwee kwuo si. “Ka enwe e ihe”.
Ihe e wee di. Chineke wee kpoo ihe ubochi, ochichiri buru abali/uhuru chi. Chineke wee kee ututu/chi obubo na abali/uhuruchi ubochi nke mbu.
Ubochi nke abuo, Chineke wee chikota odo nmiri nile di na-okpuru eligwe onu. Ubochi nke ato, Chineke wee kwubie okwu si, “Ka enwe okporo ala/ala kporo nku”. O di ka chineke siri kwuo.
Chineke nyekwara iwu ka ahihia, akwukwo osisi na ukwu osisi nile puta. Ihe ndi ahu nile wee puta ka Chineke siri kwuo. Abali/uhuruchi na chi obubo wee di ubochi nke ato.
Chineke wee kee kwa anwu, onwa na kwa kpakpandu nile nke eluigwe nke mmadu obula apughi iguta onu. Abali/uhuruchi na ututu/chi obubo wee di ubochi nke ano.
Umu anumanu, azu mmiri na umu anu ufe nile bu ihe ozo chineke kee kwara. Ubochi nke ise, Chineke kere nnukwu azu dika nma agha, umu obere azu ndi ozo, umu anumanu nile ka ha wee biri juo n'ime mmiri na kwa udi anu ufe nile ka ha no juo elu ala, ime mmiri na elu. Abali/uhuruchi na ututu/chi obubo wee ndi ubochi nke ise.
Mgbe nke a gachara, Chineke wee kwuo ozo si, “Ka okporo ala weputa ihe e kere ke nile di ndu... ” Udi umu anumanu obula nke na-agba agba na kwa nke na-ariari wee di. E nwekwara nnukwu ele nile dika elefanti na kwa beavers. Umu anu ohia ndi ozo dika monkey, anu mmiri dika krokodile, umu anu elu ala dika wiggle wormu, chipmunk, giraffu na kwa pussicat. Chineke kere umu anumanu nile otu ubochi ahu. Abali/uhuruchi na kwa ututu/chi obubo di kwa ubochi nke isi.
Ubochi nke isi, Chineke mere ihe puru iche. Ihe nile diri na udi di nma maka mmadu. E nwere ihe oriri na-ala akumaku na kwa umu anumanu di iche iche ka ha na enyere mmadu aka. Chineke wee si, “Ka anyi kee mmadu n'udi oyiyi onwe anyi Ka mmadu buru onye nlekota na kwa nchikota ihe nile e kere kee di n'uwa.” Chineke wee kee mmadu n'udi oyiyi onwe Ya, n'udi oyiyi onwe Ya ka Chineke jiri kee mmadu...
Chineke gwara Adam si ya, “Rie ihe obula i choro di n'ime ala okuku ihe oma. Mana e rikwala nke obula miputara na mkpuru osisi nke ukwu osisi ezigbo na amamihe. Ubochi obula i riri mkpuruosisi a i ga anwu.”
Chineke ka chi nile wee kwuo si, “O dighi nma ka nani nwoke noro nani ya. A ga m e kere ya onye enyemaka.” Chineke chikotara umu anu ufe nile na anu ala nile kpotara ha Adam ka onye ha aha, Adam wee nyee umu anumanu nile aha. O ga aburiri onye nwere nnukwu amamihe o jiri wee nye umu anumanu aha. Mana abia n'umu anumanu ndia o dighi nke nwere ike i bu onye enyemaka Adam.
Chineke wee mee Adam wee daa nnukwu ura di omimi, Chineke wee were otu akuku ahu Adam wee kee nwanyi. Mmadu nwanyi a Chineke kere bu ezigbo onye kwesiri i bu onye enyemaka Adam.
Chineke kechara ihe nile n'ubochi nke isii. Chineke wee gozie ubochi nke asaa ma mee kwa ya ubochi ezumike. N'ime ala okuku ihe oma bu Eden, Adam na nwanyi ya bu Eve nwere nnukwu onu n'iruwere Chineke isi. Chineke wee buru Chi ha, onye na enye ha ihe di iche iche na ezigbo enyi ha.
Ngwucha
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kedu ka o si malite? Ebee ka anyị si bịa? Gini mere nhụjuanya di n 'uwa? Enwere olileanya ọ bụla? Enwere ndụ mgbe a nwụsịrị? Chọta azịza gị ka ị na-agụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Bible for Children, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bibleforchildren.org/languages/igbo/stories.php