Akwukwo Akuko Nso Maka Umu NtakiriIhe Atụ
Otutu mgbe gara ga, Chineke zigara nmuo oma aha ya bu Gabriel na ebe otu nwagbogho onye Jew aha ya bu Mary. Nmuo oma ahu gwara ya si, “I ga amu otu nwa nwoke nke aha ya ga abu Jisos. A ga akpo nwata nwoke okpara Chineke kacha ihe nile. O ga chigide rue mgbe ebi ebi.”
“Kedu ka ihe di otu a ga eji bia mezue?” Mary n'ihe mgbagoju anya juru ajuju a. “Amabeghi m nwoke obula.” Nmuo oma ahu agwa Mary si, nwata nwoke a i ga amu ga site Chineke bia. A gaghi enwe mmadu dika nna nke uwa ga amu ya.
Nmuo oma a gwara Mary na nwa nwanne mama di ime omumu na-nka. Ihe a bu ihe oru ebube ma o bu oru aka Chineke. Ka obere oge gachara, Mary gara leta Elizabeth. Ha abuo wee too Chineke.
Mary na Josef ekwerikoritala na ha ga alu onwe ha, obi adighi Josef nma mgbe o choputara na Mary di ime omumu. O chere na onwere otu nwoke ozo nke tuwara Mary ime ahu onye nke ga abu nna nwa ahu Mary di ime ya.
N'ime nro, nmuo oma Chineke biakwutere Josef gwa ya si, nwata nwoke a bu nwa Chineke. Ya mere gi bu Josef ga enyere Mary aka lekota Jisos.
Josef tukwasiri Chineke obi ma ruwere Ya isi. O ruwekwara iwu obodo isi. Maka iwu ohuru amara, Josef na Mary laghachiri obodo amuru ha bu obodo Betlehem ka ha kwuo ugwo iwu ochichi obodo.
Mgbe oge imu nwa Mary ruru, Josef ahughigi ulo ebe Mary nwere ike imu nwa, onu ulo nile juru eju.
Josef mechara chota ulo anumanu. Ebe a ka amuru Jisos, mary bu nne Jisos kusara nwa ya n'ime ihe eji enye umu anumanu nri ma obu ebe a na edosara umu anumanu nri.
N'ebe di nso, ndi ozuzu aturu no n'echekwa umu aturu ha no n'ura. Nmuo oma nke Chineke biakwutere ha wee zie ha ozioma oru ebube Chineke a. N'ubochi taa ka amuru na mba/agburu David onye nzoputa anyi bu christi bu Chineke. I ga ahu nwata nwoke ka enyiwere ya n'ihe eji enye umu aturu nri.
N'oge na atughi anya, otutu ndi nmuo oma ndi ozo na egbu amu ma putachara, were too Chineke na asi, “Otito diri Chineke n'elu kacha elu na uwa udo na ihe oma diri ndi mmadu.”
Ndi ozuzu aturu a gawara oso oso n'ulo aturu ebe amuru Onye nzuputa. Ka oge ha gara leta ma obu hu nwata bu Jisos Onye nzoputa gachara, ha gwara ndi mmadu na ha ahula ihe ndi mmuo oma/mmuo ozi kwuru maka Jisos.
Ka ubochi iri ano gachara, Josef na Mary kpotara Jisos n'ulo nso Chineke di na Jerusalem. Ebe ahu ka otu nwoke aha ya bu Simeon onye ozi Chineke wee too Chineke n'ihi nwa a bu Jisos, otu okenye nwanyi bukwa onye ozi Chineke ozo, kele kwa Chineke. Ndi ozi Chineke abuo mara na Jisos bu Okpara Chineke, onye Nzoputa ekwere na-nkwa. Josef nyere umu anufe abuo were tuoro Chineke aja ekele. Nke a bu ihe onyinye dika iwu Chineke siri kwuo na ndi ogbenye ga ejiri bia maka ikuputa nwa n'ihu Chineke.
Otu mgbe biara, kpakpando puru iche dutere umu nwoke ato bu ndi akporo ndi oke amamihe si na ndida anyanwu bia na Jerusalem. Kedu ebe nwata ahu amuru bu eze ndi Jew noo? Ha juru ajuju a. “Ka anyi kporo Ya isiala”.
Eze Herod nuru maka ndi amamihe ato a. Ihe a nyere ya nsogbu nke ukwu u, o juru ha ka ha gwa ya ebe amuru Jisos. “A choro m i kpokwara Ya isi ala,” Eze Herod si wee kwuo. Mana o bu asi/ugha ka Eze Herod n'ekwu. Herod choro igbu nwata ahu bu Jisos.
Kpakpando a duru dugidere mmadu ato ndi amamihe ruo na ulo ahu ebe Mary, Joseph bi na kwa nwa ha bu Jisos. Ha gburu ikpere n'ala nke i ji kpoo isiala nye Ya, ndi njem a nyere Jisos ihe onyinye di iche iche dika Ola edo, ihe nwere isi oma nke a na agba n'ahu.
Chineke doro ndi oke amamihe ato a aka na nti ka ha laghachi azu n'ulo ha na nzuzo. Eze Herod were iwe nke ukwu u ma nwe kwa nkpebi igbu Jisos, Eze Herod onye obi ojoor wee gbuo umu ntakiri ndi nwoke nile na betlehem.
Mana eze Herod enweghi ike igbuteli Okpara Chineke, Chineke doro ha aka n'nti, Josef kporo nwanyi ya bu Mary na kwa nwa ha bu Jisos kpoga ha ebe o dighi ihe o bula ga emetu ha n'obodo Egypt (ijipt).
Mgbe eze Herod nwuru, Josef kpoghachitere nwanyi ya bu Mary na kwa nwa ha bu Jisos azu n'obodo Egypt (ijipt). Ha biri n'obere obodo Nazareth, nke di n'akuku mmiri Galilee.
Ngwucha
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kedu ka o si malite? Ebee ka anyị si bịa? Gini mere nhụjuanya di n 'uwa? Enwere olileanya ọ bụla? Enwere ndụ mgbe a nwụsịrị? Chọta azịza gị ka ị na-agụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Bible for Children, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bibleforchildren.org/languages/igbo/stories.php