Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị IseIhe Atụ
Onyinye Kachasị Onyinye Niile
Wepụta obere oge chee echiche ka ndụ gị ga-adị ma ọ bụrụ na Chineke eziteghị Ọkpara Ya n'ụwa. Chee echiche banyere etu ọ ga-adị ma ọ bụrụ na e nweghị nkwa nke ndụ ebighị ebi, ma ọ bụ mmekọrịta anyị na Chineke. Tụlee otú ọ ga-esi metụta mmekọrịta gị na ndị mmadụ, echiche nke onwe gị, na olileanya gị maka ọdịnihu.
N'ihi nkwa nke Ekeresimesi, ihe ọjọọ ndị ahụ niile atụrụ anya ha ime agaghị adị irè.
Ọmụmụ Jizọs bụ ngosipụta anụ-ahụ nke oké ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ibi ndụ dị nkewapụ́ n'akụkụ Onye-Nzọpụta anyị enwekataghị bụrụ ọnọdụ anyị n’ihi na Chineke zitere Ọkpara Ya ka Ọ bịa nọnyere anyị.
N'agbanyeghị otú oge a pụrụ isi jupụta n'ihe aga eme eme ma ọ bụ n'ihe isi ike, anyị na-akpọ gị òkù ka ị bịa nweta mwukwasa-ọhụrụ nke ịhụnanya Chineke. Wepụta oge tụgharịa uche n’ihe ọmụmụ Jizọs pụtara nye gị. Mgbe ị dị njikere, kpee ekpere a n'esote.
Ekpere maka Ịhụnanya:
Chineke,
Daalụ maka ịhụ m n'anya nke ukwuu nke na Ị nyere Ọkpara Gị maka m, ọbụna tupu m hụ Gị n'anya.
Ọ bụ site n’ịhụnanya Gị dị amara na nke n'adịgide adịgide ka m ji nwee ike ịghọta ihe mere Ekeresimesi jiri dị oké mkpa n'ezie.
Chetara m ka m tụgharịa uche n’onyinye nke Ọkpara Gị n’ụbọchị ndị na-eduga n'Ekeresimesi.
Gbanwee m ka m bụrụ onye hụrụ ndị ọzọ n'anya dịka Ị siri hụ m n'anya.
Biko gosi m ka m ga-esi n'eje ije mgbe niile n’ịhụnanya Gị, n'ihi na ịhụnanya zuru oke na-achụpụ egwù.
Ahụrụ m Gị n'anya, Onye-nwe-anyị.
N’aha Jizọs,
Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.
More