Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị IseIhe Atụ
Nkwa Udo
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha: “Unu atụla egwù. M na-ewetara unu ozi ọma nke ga-eme ka mmadụ niile nwee ọṅụ dị ukwuu. Taa n'obodo Devid ka a mụụrụ unu Onye-Nzọpụta; ọ bụ Ya bụ Mezaya ahụ, Onye-nwe-anyị.” Luke 2:10-11 NIV
N’isiakwụkwọ anọ dị mkpirikpi nke Akwụkwọ Nsọ na-akọ akụkọ banyere Ekeresimesi, e kwuru, “unu atụla egwù” ugboro ise.
Udo dị ụkọ n'oge a mụrụ Jizọs. Mmekọrịta Meri na Josef nọkwa n'enwe nsogbu. E nwere ọgba-aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E nwere ụwa jupụtara n'ihe mgbu Onye Nzọpụta dị mkpa. Ọkwà ọ dị gị ka ihe n'eme ugbu a?
Ọmụmụ Jizọs bụ otu n’ime nzọụkwụ kacha mkpa na atụmatụ Chineke ịgbapụta ụwa. Ọbịbịa Jizọs bụ nrutu-aka n'ihe dị nnukwu mkpa gaje ime. Ọ bụ mmalite amụrụ site n'ihe dị kà njedebe ọjọọ n'enweghị olileanya.
Chineke zitere anyị Ọkpara Ya n'ihi na Ọ chọrọ ka anyị nweta udo Ya zuru oke. Ugbu a, kwụsịtụ wee chee echiche banyere otu akụkụ nke ndụ gị ọ dị gị mkpa ịrịọ Chineke ka O mee ka obi gị daa jụụ, dị nnọọ ka O meere Meri, Josef, na ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ n’afọ ndị ahụ nile gara aga.
Ekpere Maka Udo:
Chineke,
Daalụ maka izitere anyị Ọkpara Gị, Onyeisi Udo.
Biko jiri udo Gị chekwaa obi m na uche m n'Ekeresimesi a. Ị mà ihe ndị niile n'enye m nsogbu site na nchegbu, obi ezughị okè, ma ọ bụ egwù.
Nyere m aka ka m tinye uche m na Gị, nyerekwa m aka ịnakweré ọnụnọ nke ịhụnanya Gị nke a na-ahụ anya.
Daalụ maka ilekọta m, na iso m n'alụ ọgụ nke ndụ m niile. Ọ dịghị mgbe Ị na-enye m mmụọ egwù, kama Ị na-ewetara m ndụ na udo.
Nyere m aka itọgbọ egwù m n'ihu Gị ma jiri obi m niile tụkwasị na Gị n'oge a.
N’aha Jizọs,
Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.
More