Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị IseIhe Atụ
Itụ Anya Ekeresimesi
N'ihi na a mụụrụ anyị otù nwa, nye anyị otù nwa-nwoke, ọchịchị ga-adịkwa n'ubu-Ya. A ga-akpọkwa Ya Onye-Ndụmọdụ Dị ebube, Chineke Dị Ike, Nna Ebighị Ebi, Onyeisi Udo. Aịzaya 9:6 NIV
Kedụ ihe ị na-achọ n'Ekeresimesi a? Ikekwe ị n'atụgharị uche na mkpebi siri ike ịchọrọ ime, ya adị gị mkpa inata ndụmọdụ n'aka Onye-Ndụmọdụ Dị Ebube. Ikekwe ọ dị ka ike ịgba mbọ n'ike aka gị agwụla gị, gị na-achọ Chineke ahụ Dị Ike. Ikekwe ya abụrụ na ị pụghị ịnọnyere ezinụlọ gị n'Ekeresimesi a, gị chọọ enyemaka Nna Ebighị Ebi. Ikekwe ya abụrụ na ị n'enwe mgba echiche, gị na-achọsi ike mmetụ-aka nke Onye-isi Udo.
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma laa tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ezi ihe kpatara anyị ji eme ememe Ekeresimesi… mana ọ kwesịghị ịdị otu a.
Oge Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'arụ ọrụ dịka oge atụmanya na ntụgharị uche na-eduga n'oge Ekeresimesi. Site na nsụgharị ya mbụ na asụsụ Latin, Amụma Ọkwa Ọbịbịa pụtara ọbịbịa dị mkpa, mbịaru nso, ma ọ bụ ọbịbịa. Ọ bụ oge e ji echeta ihe nile Chineke meworo na atụmanya maka ihe nile Ọ ga-eme.
Oge Amụma Ọkwa Ọbịbịa bụ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara bịa nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. Anyị nwere ohere inweta ndụmọdụ dị ike nke ebighị-ebi nke Chineke na udo Ya n’ihi na O zitere Ọkpara Ya ka Ọ bịa bụrụImmanuel, “Chineke nọnyeere anyị.” Anyị ji ekpere n'echere ma na-atụ anya nloghachi nke Onye-nzọpụta anyị, otú ahụ ndị Izrel si nọrọ ji atụmanyá dị egwù n'echere mmezu amụma Agba-ochie ndị ahụ e buru gbasara Mezaya ahụ.
Olileanya anyị bụ na atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-enyere gị aka ilekwasị anya n'ihe Ekeresimesi pụtara n'ezie. Kwa ụbọchị, anyị ga-enyocha otu n'ime isiokwu nkọwa nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa: olileanya, udo, ọṅụ, na ịhụnanya.
Soro anyị n'ịkwado obi gị maka ọbịbịa nke Onye-Nzọpụta anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.
More