Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị IseIhe Atụ
Ọṅụ Nke E Debere N'ihu Anyị
Mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ, obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu nke na ha tiri mkpu ma were ọṅụ n'enweghị njikwa tụọ ụzụ̀. Mgbe ha batara n'ụlọ anụ ahụ, hụ nwatakiri ahụ na nne Ya bụ Meri, ha dara n'ala n'ihu ụkwụ-Ya, wee kpọọ isi ala nye Ya. Matiu 2:10-11a TPT
Añụrị: mmesi obi iké nke ekele jupụtara nà Chineke na-achị ma na-arụ ọrụ niile maka ọdịmma anyị na otuto Ya.
O nwere ike isirí anyị ike inwe ọṅụ n’oge na-eduga n'Ekeresimesi. Oge ezumike nwere ike ijupụta na mgbakasị ahụ́, ihe aga eme eme n'adịghị agwụ agwụ, enweghị onye nnọnyere, ma ọ bụ ihe mgbu.
Mana, ọṅụ nke ọbịbịa Jizọs n'eweta abụghị nke dabeere n'ihe anyị na-agabiga ma ọ bụ bụrụ nke n'adịghị anọgide. Ọ na-adịgide adịgide ma kwurú chịm. Ọ bụ ọṅụ nke mgbidi ụwa a na-apụghị ijikwa.
Ọmụmụ Jizọs abụghị ọbịbịa eze onye ọ bụla tụrụ anya ya. Mana, ọ gbanwere ihe niile. N’otu ntabi anya, Ọkpara Chineke ghọrọ “Chineke nọnyeere anyị”—ihe karịrị afọ 2,000 ka e mesịrị, ụwa anyị a ike gwụrụ ka na-aṅụrị ọṅụ n'ihe dị otu ahụ mere.
Taa, anyị na-akpọ gị òkù ka ị nwee obi ụtọ n’ihe ebube nke ọmụmụ Jizọs.
Ekpere Maka Ọṅụ:
Jizọs,
Daalụ maka ịbụ Immanuel, Chineke nọnyere anyị. Ọ bụ n'ihi Gị ka m jiri nwee ike inweta ezi ọṅụ.
Ị tozuru okè inara otuto, nsọpụrụ, na ike niile—ya mere n’agbanyeghị ihe ọ bụla m chere ihu, m ga-ahọrọ ife Gị òfùfè.
Nyere m aka iwere ya ka ihe ọṅụ nye m mgbe m na-agabiga ọnwụnwa n'ihi na amaara m na Ị na-eke ihe mara mma na nke dị ebighị-ebi maka m.
Chineke, chetara m ka m n'agbaba na Gị na n'enwe añụrị. Nkasi obi Gị na-enye m olileanya-ọhụrụ na obi ụtọ. N'iru Gị ka uju ọṅụ dị!
N’ihi ọbịbịa Gị n'ụzọ dị umeala ihe karịrị afọ 2,000 gara aga, a pụrụ m ịnweta ọn̄ụ nke ọnụnọ Gị ruo mgbe ebighị ebi. Nara ekele m.
N'aha Jizọs,
Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.
More