Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị IseIhe Atụ
Ụtọ Nke Olileanya
Ka e were ya na ọ bụ abalị dị jụụ gbará ọchịchịrị, gị nọrọ n’mbara ala nke atụrụ jupụtara ma gbaa ya gburugburu. Ozugbo, ìgwè ndị mmụọ ozi e wee pụta wee tie na ka afọ narị anọ nke ime nchere gasịrị, olileanya nke ụwa abịala—nwa ọhụrụ a na-akpọ Immanuel, “Chineke nọnyeere anyị.”
Ó nwere ike ịdị mfe ilekwasị anya n'ọnọdụ ma ọ bụ ahụmịhe siri ike, ọkachasị ihe nsogbu nke afọ gara aga. Mana Amụma-Ọkwa Ọbịbịa na-enye anyị ohere ịtụgharị uche ná nkwa Chineke na ilekwasị anya na Jizọs.
Oge a na-echetara anyị na anyị nwere ohere inweta otu olileanya ahụ ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ nwere n’afọ ndị ahụ niile gara aga—n’ịmara na Chineke nke eluigwe na ala na-abịa anyị nso ịnụ akwa anyị na igwọ obi anyị.
N’agbanyeghị otú ọchịchịrị ahụ siri sie ike ma ọ bụ dị ịtụ ụjọ, anyị pụrụ ịtụkwasị obi nà nkwa niile e dere n’Okwu Chineke dị adị dị irè. Wepụta nwa oge, kwụsịtụ ma tụlee ikwesị-ntụkwasị-obi nke Chineke ka anyị na-adaberé na olileanya n'oge a.
Ekpere maka Olileanya:
Chineke,
Ka anyị n'erute oge Ekeresimesi nso, nyere m aka ka m kwụsịtụ wee cheta ihe niile Ị meworo na ndụ m, ezinụlọ m, na obodo m.
Ana m ekele Gị n’ihi na Ị bụ Chineke na-azọpụta. Ana m ekele Gị n'ihi na olileanya m dị n'ebe Ị nọ, ọ dịghị n'ọnọdụ m ma ọ bụ na ndị mmadụ.
N'ihi na m nwere olileanya na Gị, enwere m obi-ike na Ị ga-emezu nkwa niile Ị kwere m. Chetara m ihe bụ́ ya dị mkpa taa. Nyere m aka ịhụ ka Ị si na-arụ ọrụ n'etiti nchere m.
Mee ka m bịaruo Gị nso n’oge Ekeresimesi a, kwadokwaa obi m maka inata mmezu nke nkwa Gị niile.
N’aha Jizọs,
Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.
More