Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ígwè Na-Anụcha Ígwè: Life-to-Life® Ndụzi N'ime Agba OchieIhe Atụ

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ụbọchị Nke Ise:Modekaị Na Esta

Na mbụ anyị lebara anya n’akụkọ Naomi na Rut wee hụ otú nne di siri rụọ ọrụ dị mkpa n’ịduzi nwunye nwa ya. N'ebe a anyị na-ahụ otú Chineke nwere ike iji anyị n'emetụta ndụ nke ndị òtù ezinụlọ anyị maka mgbe ebighị ebi, ọbụna nwa nwanne nna n'eto eto (ma ọ bụ nwa nwaanyị) n'adịghị ka anyị dị.

Modekaị bi n'ime Susa, Peshia, n’oge akwaralà ndị Chineke gaa biwe ha n'ala ndị ọzọ. Ọ malitere zụlitewa nwa nwanne nna ya, bụ́ Esta, bụ́ onye o weere dịka nwa ya nwaanyị. Ka akụkọ ha n'aga n'ihu, anyị na-ahụ otú o si bụrụ onye kwesịrị ekwesị ịnọ n'akụkụ Esta n’oge kwesịrị ekwesị, anyị n'ahukwa otu Esta si buru onye kwesịrị ekwesị iguzo n’etiti ndị Chineke na ndị iro ha “n’oge dị otú a”!

N'ime isi akwụkwọ iri nke akwụkwọ Esta, anyị na-ahụ otú nwa agbọghọ a ana-atụghị anya siri ghọọ nwunye eze. N’ihi na ọbụ onye ntorobịa n'enweghị ahụmahụ nke ụwa, na n'ihi na ọbụ onye Hibru a dọọrọ n’agha, ọ dịịrị Esta mkpa ka ọ nata nduzi sitere n'aka okenye katara ahụ n'ahụmahụ nke ụwa.

Nwanne nna Esta bụ Mọdekaị du Esta wee n'aga, na ka Esta n'ege ya ntị, o bidoro natawa ihu ọma n'anya ndị nile nọ okirikiri ya. Mgbe akparà nkata ibibi ndị Juu niile nọ n’ala ahụ, Mọdekaị duuru Esta nzọụkwụ ọ bụla iji tụkwasị Chineke obi na ịrịọchitere ndị Chineke arịrịọ.

Chineke setịrị aka ebube Ya wee rụọ ọrụ! Ọ bụghị nanị na nduzi Mọdekaị gbanwere ndụ Esta, kamakwa ọ gbanwere otu mba. Ọ bụghị naanị na Chineke chekwaberè ndị Ya, kamakwa O chekwakwarà ọbịbịa nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst n’ikpeazụ!

Nke bụ́ eziokwu bụ na, ọ dịghị mgbe anyị maara ihe Chineke bù n'obi mgbe Ọ n'edu anyị ma ọ bụ jiri anyị n'eduzi onye ọzọ n'ije ije Ndụ-rue-Ndụ. Ee, Chineke hụrụ onye ọ bụla n’anya o wee bụrụ agụụ nke obi Ya ihu ka anyị n'eto eto mgbe nile rue n'ime ihe nke Ya karịsịa. N'otu aka ahụ, dị ka anyị hụworo ná mmekọrịta Ndụ-rue-Ndụ nile nke anyị leworo anya, o doro anyị anya na Chineke na-arụ ọrụ mgbe nile n'ụzọ magburu onwe ya imezu nzube Ya gasị n'ime ụwa a—site n'iji ndị dị ka mụ na gị n'usoro ime ihe ndị ahụ!

Ka ntụle nke a nkè mmekọrịta nduzi Ndụ-rue-Ndụ n’ime Agba Ochie kpalie gị itinye uchu n'iduzi na ihazi ndụ ndị gbara gị gburugburu—ebe ị bi, ebe ị n'arụ ọrụ, na-ebe ị n'ekpe ekpere!

Ọ ga-amasị anyị ikele Dean Ridings, onye dere The Pray! Prayer Journal, maka atụmatụ ihe ọgụgụ a. Biko gaakwa na, The Navigators.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike "imeta ndị n'eso ụzọ n'emeta ndị n'eso ụzọ," ga-eso iwu Jizọs ná Nnukwu-Nzipụ-Ozi Ahụ (Matiu 28:18-20)? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ ga-esi ike ịchọta ndị guzoro na kwụ chịm a pụrụ ilekwasị anya maka usoro a. Olee ihe atụ nke onye ị pụrụ iso? Olee otú imeta ndị n'eso ụzọ n'adị ná ndụ kwa ụbọchị? Ka anyị leba anya n’ime Agba Ochie ka anyị hụ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị ise si zụlite ndị ọzọ, Life-to-Life®.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Navigators maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.navigators.org/youversion