Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ígwè Na-Anụcha Ígwè: Life-to-Life® Ndụzi N'ime Agba OchieIhe Atụ

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ụbọchị Nke Mbụ: Ebraham Na Lọt

Ebraham na-enye anyị otu n’ime ihe atụ mbụ nke nduzi n’ime Agba Ochie. Ya na nwa nwanne ya bụ Lọt soro wee n'aga, bụ onye soro ya wee si n'obodo nna ha Ur pụta, ịbanye n'ala ọhụrụ Chineke kwere ha na nkwa.

Site ná mmalite, Ebraham bụ onye ndụzi site n'ihe atụ o gosiri. Lọt nọ n'ele anya ka Ebraham n'ezute, na anụ olu, ma n'agwa Chineke okwu. Ọ hụrụ ka Ebraham siri wuoro Onye-nwe-anyị ebe ịchụàjà gasị, bụ́ Onye gosiri ya Onwe Ya. Lọt hụkwara otú Ebraham si jiri obi ya niile na ihe niile o jiri bụrụ mmadụ dabere na Chineke, bụ́ Onye ya onwe ya bịara tụkwasịkwa obi na.

Mgbe Onye-nwe-anyị mere ka ha abụọ baa ụba rii nne, oge ruru mgbe ala ahu apụghịzi izù ìgwè ewu na atụrụ-ha na ìgwè ehi-ha na ụlọ-ikwu-ha, nke kpatara na ọ ji dị mkpa ka ha kewaa. N'obiọma, Ebraham kpọrọ Lọt ka ọ bụ ụzọ họrọ ebe ọ ga-ebi, ma Ebraham ewee jee ebe ọzọ gaa biri.

Rịba ama otú Ebraham si legide nwa nwanne ya anya. Ọ gbatara Lọt ọsọ enyemaka mgbe ọ nọ ná nsogbu, o kpesikwara ekpere ike ma rịọ Chineke nnukwu arịrịọ maka Lọt na ezinụlọ ya mgbe nsogbu ọzọ bilitere.

Olee ihe mmụta bara uru na ndụmọdụ nke ndụ-rue-ndụ anyị nwere ike iwepụta na mmekọrịta a? Nke mbụ, elelịla iké ihe-atụ-onwe-nke-gị anya! Site na ka ị si ebi ndụ, ị bụ onye-nduzi nye ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị gị na ha na-emekọrịta ihe.

Nke abụọ, anyị kwesịrị ihapụ ndị anyị na-enye ndụzi ka ha hazie ụzọ nke ha. Nnọkọ anyị na ha agaghị adịte aka, anyị ga-ahapụrịrị ha na nlekọta Chineke n'ije ndụ ha niile. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ime mkpebi dara nzuzu, ọbụnadị nhọrọ funahurú ha oké ihe (Jenesis 19:8, 33,34). N'otu aka ahụ, anyị agaghị ahapụ ha kpamkpam. Anyị ga-anọgide na-adị njikere ka Chineke jiri anyi n'ekwu eziokwu n’ime ndụ ha, ime ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ibi ndụ ogologo, ndụ na-amị mkpụrụ n’ime Onye-nwe-anyị.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike "imeta ndị n'eso ụzọ n'emeta ndị n'eso ụzọ," ga-eso iwu Jizọs ná Nnukwu-Nzipụ-Ozi Ahụ (Matiu 28:18-20)? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ ga-esi ike ịchọta ndị guzoro na kwụ chịm a pụrụ ilekwasị anya maka usoro a. Olee ihe atụ nke onye ị pụrụ iso? Olee otú imeta ndị n'eso ụzọ n'adị ná ndụ kwa ụbọchị? Ka anyị leba anya n’ime Agba Ochie ka anyị hụ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị ise si zụlite ndị ọzọ, Life-to-Life®.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Navigators maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.navigators.org/youversion