Ígwè Na-Anụcha Ígwè: Life-to-Life® Ndụzi N'ime Agba OchieIhe Atụ
Ụbọchị Nke Atọ: Naomi Na Rut
Dịka Chineke si mee ka Mozis kpọlite Jọshụa ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị Ya n’ọdịnihu, otú ahụ ka Chineke si jiri Naomi kpọlite Rut, bụ́ nwunye nwa ya, n'oge sịrị ike na n'oge ịma jijiji na ndụ ya.
Anyị na-agụ akụkọ gbasara ha n'ime isi akwụkwọ anọ nke akwụkwọ Rut. Akụkọ ha mere n’oge Ndị Ikpe mgbe ndị Hibru bi n’ala ahụ e kwere ha ná nkwa ma tupu ha enwee eze mbụ ha. Oké ụnwụ nke dị n’ala ha mere ka otu nwoke aha ya bụ Elimelek, na nwunye ya Naomi, na ụmụ ha ndị ikom abụọ si na Betlehem kwagaa Moab.
O rughị ọtụtụ afọ ha kwagara na ala Moab, ihe ọjọọ ewee dakwasị ha nke bụ na Elimelek nwụrụ. Ụmụ nwoke Naomi abụọ lụrụ ndị inyom Moab, ihe ọjọọ ewee mekwaa ha nke bụ na ụmụ nwoke abụọ ndị ahụ nwụrụ. Otu nwunye ndị nwoke ahụ nwụrụ́ nọghachịrị na Moab, ebe nke ọzọ, bụ́ Rut, so nne di ya laghachi Betlehem.
Rut, bụ́ onye ala ọzọ na Juda, bụ́ ala di ya, nọnyere Naomi nso, bụ́ onye ghọrọ onye nduzi ya. Ị chee banyere ya, nnukwute ihe dị iche dị na ha abụọ. Otu bụ agadi, ma onye nke ọzọ emebeghị okenye. Ha si n’agbụrụ, omenala, na okpukperechi dị iche iche.
N'agbanyeghị nke a, n'ịgụ akụkọ ha, anyị na-ahụ ndabere dị mma na nke mara mma n'etiti ha. Anyị na-agbakwa àmà ka Rut na Naomi n'abanye na mmekọrịta nke ọgbụgba ndụ, bụ́ nke gụnyere nkwa sitere n’obi nke Rut: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị ga-anwụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n'ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Onye-nwe-anyị mee m ihe ọjọọ, meekwa m ihe ọjọọ ọzọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọnwụ kewapụrụ m n’ebe ị nọ.”
Ka akụkọ ha n'aga n'ihu, Naomi nọgidere n'eduzi Rut, Rut ewee zute ma soro otu nwoke aha ya bụ Boaz n'enwe mmekọrịta n'eto eto. Ndụmọdụ ya duziri Rut ka ya na Boaz baa n’alụmdi na nwunye. Rut ga-emecha bụrụ nne nne Eze Devid, wee si otú a bụrụ onye-otù agbụrụ nke Jizọs, bụ́ Mezaịa ahụ!
Akụkọ ha na-echetara anyị ezigbo uru dị na mmekọrịta dị n’etiti ọgbọ n'ọgbọ na ndụ rue na ndụ. Anyị na ibe anyị dị mkpa nye onwe anyị n'ezie! Nke a bụ nnọọ ihe nzụlite nke ndụ-rue-ndụ bụ̀, onye nà ibe ya ana-ekeritara onwe ha ndụ ha—“n'emekọ ihe ọnụ.” Dị ka anyị na-ahụ n'akụkọ banyere Naomi na Rut, mmekọrịta dị otú ahụ pụrụ ọbụna ịpụta kpọmkwem n’ezinụlọ anyị!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike "imeta ndị n'eso ụzọ n'emeta ndị n'eso ụzọ," ga-eso iwu Jizọs ná Nnukwu-Nzipụ-Ozi Ahụ (Matiu 28:18-20)? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ ga-esi ike ịchọta ndị guzoro na kwụ chịm a pụrụ ilekwasị anya maka usoro a. Olee ihe atụ nke onye ị pụrụ iso? Olee otú imeta ndị n'eso ụzọ n'adị ná ndụ kwa ụbọchị? Ka anyị leba anya n’ime Agba Ochie ka anyị hụ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị ise si zụlite ndị ọzọ, Life-to-Life®.
More