Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ígwè Na-Anụcha Ígwè: Life-to-Life® Ndụzi N'ime Agba OchieIhe Atụ

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Ụbọchị Nke Abụọ:Mozis Na Joshua

Mozis bụ nwoke Chineke ji mee ihe dị mkpa n'akụkọ nke ndị Chineke. Chineke ji ya duru ndị Hibru sí n’Ijipt pụta ma mesịa ruo na ụzọ mbata ala ahụ e kwere ná nkwa.

Mozis họpụtara ndị ikom iri na abụọ, bụ́ ndị nọchitere anya ebo iri na abụọ nke Izrel, ilegharị anya n'ala ahụ. Otu n’ime ha bụ Jọshụa nwa Nun, onye si n’ebo Ifrem (Ọnụ Ọgụgụ 13:16). Ya, na onye ọzọ só n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ́ Keleb, wetara ezi akụkọ n'egosipụta obi ike na, site n’enyemaka Chineke, ha pụrụ inweta ala ahụ e kwere ná nkwa!

Mmekọrịta Mozis na Jọshụa n’ime akwụkwọ nke Ọpụpụ na Ọnụ Ọgụgụ na-egosi ịdị mkpa nke inye ndụzi n’etiti ọgbọ kwuru ọgbọ, na n'etiti ndụ-rue-ndụ. (Iji tụgharịkwuo uche dị ime na nke a, lee Ọpụpụ 24:13; 32:17; 33:11; na Ọnụ Ọgụgụ 11:25-29; 13:1-14:10.)

N’ime njem afọ iri anọ nke ndị Hibru jere n’ala ịkpa Saịnaị, Onye-nwe-anyị ji Mozis wulite otu nwoke ka ọ bụrụ "FAT", onye dịFaithful (Ntụkwasị-obi),Available (Nwere ohere ịrụ ọrụ Chineke), na Teachable (A pụrụ ịkụzinwuru ihe ya ejiri obi ọma mụta ya). N’ime nke a, site na nduzi nke ndụ-rue-ndụ, Mozis zulitere onye ndú ọzọ ndị Hibru. Jọshụa mesịrị duru ndị Chineke banye n’ime ala ahụ e kwere ná nkwa.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ nke Mozis? Jiri ekpere tụlee ịbịakwu nso nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa nọ n'ọgbakọ ndị gị na ha so emekọrịta ihe. Dịka Chineke siri gosi Mozis onye nọgidere ya nso ma nọgide Chineke nso, ikekwe Chineke ga-egosi gị onye “FAT” nọ n'akụkụ gị. Kedụ ndị bụ ndị ikom na ndị inyom Chineke nke echi? Ikekwe Chineke ga-eji gị kpọlite ​​onye ndú nke ezinụlọ, ndị enyi, ọbụna nke ụka ma ọ bụ ọgbakọ Kraịst dị obere!

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iron Sharpens Iron: Life-to-Life® Mentoring in the Old Testament

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike "imeta ndị n'eso ụzọ n'emeta ndị n'eso ụzọ," ga-eso iwu Jizọs ná Nnukwu-Nzipụ-Ozi Ahụ (Matiu 28:18-20)? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ ga-esi ike ịchọta ndị guzoro na kwụ chịm a pụrụ ilekwasị anya maka usoro a. Olee ihe atụ nke onye ị pụrụ iso? Olee otú imeta ndị n'eso ụzọ n'adị ná ndụ kwa ụbọchị? Ka anyị leba anya n’ime Agba Ochie ka anyị hụ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị ise si zụlite ndị ọzọ, Life-to-Life®.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Navigators maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.navigators.org/youversion