Ígwè Na-Anụcha Ígwè: Life-to-Life® Ndụzi N'ime Agba OchieIhe Atụ
Ụbọchị Nke Anọ:Devid Na Jonatan
Ọbụbụenyi dị n'etiti Devid na Jonatan n'enye nkọwa ọzọ otu ndụzi nke Ndụ-rue-Ndụ dị.
Eze Sọl bụ eze mbụ nke Izrel, Jọnatan bụkwa nwa ya. N'agbanyeghị na mmalite Sọl abụghị ihe eji kpọrọ ihe, o ji nwayọọ nwayọọ malite ileghara Chineke anya ma malite iguzobe ọbụbụeze ya. Otu akụkụ nke ịkwadobè ọbụbụeze ya ahụ bụ ịgba mbọ ihu na otu ụbọchị, Jonatan ga-anọchi ya dị ka eze.
Mana nke ahụ abụghị atụmatụ Chineke. Kama, Chineke duuru onye amụma, bụ́ Samuel, ka ọ gaa tee nwa okorobịa Devid bụ́ onye ọzụzụ-atụrụ mmanụ dị ka onye ga-anọchi Sọl n’ikpeazụ. Devid bụ onye “dị ka obi Chineke si dị.” N'ụzọ dị mwute, Eze Sọl adịghị otù ahụ. Ya mere, n’ihi ekworo dị ukwuu, Sọl bidoro chughariwá Devid akwụsịghị akwụsị n’ebumnobi igbu ya na imeghere Jọnatan ụzọ ka o were ocheeze wee nọchie ya dị ka eze. (Gụọ 1 Samuel 1-31.)
N'ime ọgba aghara ahụ nile, ihe ana-atụghị anya ya mere: Devid na Jọnatan ghọrọ enyi nke mkpụrụ obi ha kekọtara ọnụ; “Ekekọbara mkpụrụ-obi Jonatan na mkpụrụ-obi Devid, Jonatan we hụ Devid n'anya dịka mkpụrụ-obi-nke-ya.” Enweghị asọmpi dị n'etiti ha, ma ọ bụ nchegbu na otu n'ime ha nwere ike ime ihe ga-ewetara ibe ya ihe ufu: ha abụọ kpebisiri ike ịnọnyere ibe ya n'agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha.
Anyị na-ahụ òkù ana-akpọ maka mmekọrịta bara uru dị otú ahụ n'ime Akwụkwọ Nsọ. Ọ pụtara ìhè karịsịa n’ilu abụọ: “Nwoke nwere ọtụtụ enyi pụrụ ịbịa na mbibi, mana e nwere enyi na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne,” na, “Ígwè na-anụcha ígwè, otu onye na-anụcha ibe ya” (Ilu 18: 24; 27:17).
Site n'ọbụbụenyi enyi Devid na Jonatan, anyị na-amụta mkpa ọ dị inwe “onye ngbachite” n’ezie. Dị ka nwa Devid bụ́ Solomọn ga-ede, n’ezie inwe onye nnọnyere ka mma karịa ịnọ naanị gị (Ekliziastis 4:9-12), na tinyéré Chineke n’ime mmekọrịta ahụ, “ụdọ̀ atọ a tụkọtara ọnụ abụghị nke a pụrụ idobi ngwa ngwa” (v 12).
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike "imeta ndị n'eso ụzọ n'emeta ndị n'eso ụzọ," ga-eso iwu Jizọs ná Nnukwu-Nzipụ-Ozi Ahụ (Matiu 28:18-20)? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ ga-esi ike ịchọta ndị guzoro na kwụ chịm a pụrụ ilekwasị anya maka usoro a. Olee ihe atụ nke onye ị pụrụ iso? Olee otú imeta ndị n'eso ụzọ n'adị ná ndụ kwa ụbọchị? Ka anyị leba anya n’ime Agba Ochie ka anyị hụ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị ise si zụlite ndị ọzọ, Life-to-Life®.
More