Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntụgharị-Uche Gasị Nke EkeresimesiIhe Atụ

Christmas Reflections

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Lekwa Onye Bịara

Ka esi nwee oké mmasị na nkwanye-ùgwù oge ugbu a nye ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ bịakwutere Jizọs n'ụlọ ana enye anụmanụ nri, abụghị nke habụ́ ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ ịghọta ma ọ bụ tụọ́ n'uche. Ha esoghị na ndị akacha kwanye ùgwù na ndepụta mmemme ọbụla—ma ọ bụ ihe ọbụla. Ọ bụ ihe anabatara na ndị ọzụzụ atụrụ bụ ndị dị ala, ma ọ bụ oké ala, na ka esi ele ndị mmadụ anya na obodo—ikwu ya n'uzo ọzọ, ha bụ ndị enweghị ihe eji ha kpọrọ na ọhaneze. Ma ọrụ ha ma ọ bụ ụgwọ ha abụghị ihe magburu onwe ya.

Mgbe a bịara n'ikwusa ozi ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, ọ gaara ewe onye amụma nwere ezigbo obi ike ịtụ arọ ka e tinye ndị ọzụzụ atụrụ ná ndị mbụ ga-anata yabụ ozi, ma ofokwa isi ka ìgwè ndị mmụọ ozi pụta gosi ha onwe ha. Ndị eze si ebe dị anya bịa, nke ahụ ga ekwe omume, ndị ọzụzụ atụrụ—nke a ga-esi ike. Ma, n'agbanyeghị nke a. . . ndị mmụọ ozi pụtara ìhè n’ihu ha n’abalị ahụ nke kpakpando juru wee n'ekwu si, “ozi ọma nke oké ọṅụ.” E mere ka ha bụrụ ndị bụ ụzọ nụ́ ozizi na atụmatụ nke Onye-nwe-anyị.

Ọ bụghị iwu na anyị ga-abụ oké mmadụ iji bụrụ ndị mbụ ga n'anụ atụmatụ na amamihe sitere n'ọnụ Chineke. Chineke na-ekpughe Onwe Ya nye onye ọ bụla masịrị Ya, ma site na Akwụkwọ Nsọ ndị O na-emeso otu a abụghị ndị ché na ha ruru eru ma ọ bụ ndị tozuru etozu na okpukpere-chi. Obi mepere emepe na nke na-achọsi ihe Chineke ike, akparama-àgwà nke ịbụ onye n'eje ozi, ịdị umeala nke ime mmụọ. Ọ bụ ihe ndị a ka Chineke na-achọ.

Ma ọ nwere ike ya abụrụ na ọ bụ àgwà ndị a ka ndị Mejai ahụ nwere, ebe ọ bụ na nsonye nke ha bụ nsonye gbara mmadụ gharii. O yirikà ndị Mejai ahụ ha bụ ndị n'elele kpakpando dị n'eluigwe. Nke a bụ ihe n'ara ụfọdụ n'ime ahụ inakweré, n'ihi na nlelè kpakpando n'igwe, e kwuwe, bụ ihe mmụta na nkà n'erughị ogo Sayensị n'onwe ya. Mana Chineke ejighị iwu anyị kpọrọ ihe, e nwekwara ndị nọ n’ọnọdụ na ebe dị iche iche gasị, “kwere na Ọ dị adị nakwa na Ọ na akwụghachi ndị ji obi ha niile achọsi Ya ike ụgwọ ọrụ mara mma.” Ndị na-enwu enwu ka nnukwu ọkụ n'ụwa, dịka C. S. Lewis, kwenyere na omenala nile na ndị niile bi n'ụwa nwere ihe ịrịba-ama gasị, ihe agba-àmà gasị, n'ime ha nke na-arụtụ aka n'ọmụma nke Chineke na isindụ nke ezi omume na ikpe—ọbụnadị na ụzọ ndị a ezughị oké nke ha ji ezu ezu.

O nwere ihe gbasara otu kpakpando mere ka ndị ikom a gaa nyochaa kpakpando nke Devid, bụ́ kpakpando ahụ n'egbuke egbuke na nke-ụtụtụ. Ya mere, ha jiri ji oké ịtụ-anya mee njem dị anya ruo Betlehem. Kedụ ụdị eze ha ga-ahụ ma ha ruo?

Ka m rutu aka ebe a na amaghị ụmụ nwoke ndị amamihe ole bịaranụ—o nwere ike ịbụ ụmụ nwoke atọ, mana ọ dịghị mgbe ekwuru na ha dị atọ—e kwuru okwu onyinye atọ, ee, mana nke ndị nwoke amamihe atọ, mba. Ọzọ, o yighị ka ha bịara n'oge kpọmkwem a mụrụ Jizọs. Ọ bụ ka nwa oge gasịrị. O nwere ike ịbụ ihe ruru afọ abụọ ka e mesịrị, ma ọ bụrụ na anyị eburu n'uche na Herọd chọrọ ka e gbuo ụmụ nwoke niile n'erubeghị afọ abụọ.

Ka anyị hapụ okwu a, ma hụ ka ndị nwoke amamihe ahụ sí n’ebe ọwụwa anyanwụ bịara bịa fee Eze Jizọs òfùfè. Ùgwù ruurú Ya sicha n'ebe dị ezigbo anya nke ọgbụgba ndụ ahụ, wee bịa. Ha gburu ikpere kpọọ isi ala nye nwa nwoke ahụ, a mụrụ Eze ndị Juu, nyekwa Ya onyinye ndị kwesịrị Eze. Ọṅụ juru ha obi ka ha n'enye Eze bụ Eze n'ezie òfùfè.

N'ebe a ka anyị n'emecha ntụgharị uche anyị niile—jiri òfùfè na ịtụnanya. Dị ka ndị nwoke amamihe ahụ, anyị na-efe Eze Chineke họọrọ. Ọ bụ kpakpando Ya ka anyị kwesịrị iji ọsọ gbakwuru ma chịrị ndụ anyị nyefee Ya n'aka ka onyinye. Ka anyị n'atụkwa anya oké ọṅụ iju anyị obi ka anyị n'eme otu a.

Ekeresimesi Dị Ụtọ Na Nke Jupụtara N'oké Ọṅụ diirí gị na ezinụlọ gị ka unu n'agbako wee n'eme ememme nke ọmụmụ Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst.

Ọ bụrụ na ị chọrọ inyochakwu isiokwu a ma ọ bụ gụkwuo ihe odide Simon na atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ, gaa na www.simonmcintyre.net.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas Reflections

Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Simon McIntyre maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.simonmcintyre.net/