Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntụgharị-Uche Gasị Nke EkeresimesiIhe Atụ

Christmas Reflections

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Chineke Na-Ahọrọ

Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.

Ọ bụ akụkọ nke miri emi na nke onwe n'otu mgbe, ma, bụrụkwa n'ikpeazụ nke ọhaneze maara, na jukwa anya.

Ndị mmadụ so ná akụkọ a bụ nwata nwanyị Juu ka n'eto eto; otu mmụọ ozi katara ahụ na nke ama ama, Gebriel; Josefu; ndị ọzụzụ atụrụ ime obodo; ya na ndị nwoke amamihe si n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ahutubeghị ụdị ndị a n'akụkọ ọbụla akọbere, a ká hubeghị ruo taa. Ejije ahụ ha mere nwere mmetụta zuru ụwa ọnụ, a bụghị naanị na obodo e mere ya.

Kwa afọ, a na-akọ akụkọ Ekeresimesi n'ụzọ gasị karịrị puku, n'ime ọtụtụ nde ebe. Ọ dị mfe na dị mmasị dịka ihe nwata, dị ụba ma tozuo oke na usoro mmụta okpukpe, nke ọtụtụ ndị hụrụ n'anya. À n'ekwú, kedụ onye n'ime anyị na abụbeghị nwa anụ n'ime ejije nke ọmụmụ Jizọs?

Ihe a niile malitere site n’aka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, Meri. Ya na ezinụlọ ya biri na Nazaret. Anyị ma Nazaret dịka okwu ana eji akọwa ihe ekwesịrị ichefu echefu, ihe na-abaghị oké ma ọ bụ uru chaa—“Ọ̀ dị ihe ọma pụrụ isí na Nazaret pụta.” Ọ bụchaghị mmalite dị mma mgbe onye ana amaghị nke ọma na onye elere anya na o rughị eru si na obodo echefuru echefu a hụrụ ka ọ baghị uru bụ onye a họọrọ. Mana nke a na-abụkarị mbinye aka nke Chineke na mmekọrịta Ya na ihe a kpọrọ mmadụ—“ka mmadụ ghara ịnya isi n’ihu Chineke.

Ugboro ole ka anyị na ahutá mmasị gasị, ike, na ọgụgụ isi mmadụ dịka nke Chineke? Ụzọ Ya dị ezigbo elu karịa nke mmadụ. Nke a pụtara na anyị enweghị ike ichetù ha n'echiche ma ọ bụ ghọta ha, ma ọ bụ̀ na ha bụ ụdị nke ihe anyị pụrụ ime, naanị na ike nke Chineke ji nwa obere kara nke anyị. Ịdị elu nke ụzọ Chineke n'ikọwa ya bụ na, a pụghị irute ya ma ọ bụ ghọta ya ma ọlị.

Ònyé n’ime anyị ga-agakwuru onye kasị nta bi n'ebe ọ dịghị onye chọrọ ịga, ebe n'enweghị okwu ọma banyere ya, wee họrọ onye ga-emetụta ụwa n'ụzọ dị ukwuu— ruo mgbe ebighị ebi? Anyị na-aga na mahadum ma ọ bụ ụlọ ọrụ kacha mma wee na-ahọrọ onye kachasị nwee njikwa ịrụ ọrụ. Mana Chineke adịghị eme otù a. Ọ na-ahọrọ ndị ana amaghị ama n'obodo, ndị dị umeala n'obi, ndị n'enweghị ihe ha ji onwe ha wee kpọrọ, n'ihi na ndị dị otú a maara na ọ bụghị ike ha ma ọ bụ ọgụgụ isi ha mere ka ha rụọ ọrụ ma ọ bụ mee ihe dị egwù dị otù ahụ. Ihe ha maara nke ọma bụ adịghị ike ha, erughị eru ha, ọbụbụ mmadụ ha.

Chineke na-ahọrọ ndị ana atụghị anya ha, ndị na-erughị eru ma ọlị, ndị maara nke ọma ọnọdụ ezighi ezi ha; ndị mmehie na-abụ ndị nsọ kachasị mma. N'Alaeze Ya, nrubeisi hoo haa nye Ya na atumanyá n'ụzọ Ya niile na-emeri ihe ndị ụwa kpọrọ ihe na mpako niile nke ụwa.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas Reflections

Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Simon McIntyre maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.simonmcintyre.net/