Ntụgharị-Uche Gasị Nke EkeresimesiIhe Atụ
Mgbamume Ana Atụghị Anya Ya
Chineke maara na njem ụfọdụ na-esi ike nke ukwuu, sikwuo ike ma ọ bụrụ naanị otu onye n'eme ya. Ya mere, Gebriel jiri gwa Meri na onye ikwu ya bụ Elizabet dị ime ọnwa isii. Nke ahụ n'ezie kpalitere mmasị Meri ozugbo n'ihi na Elizabet buworò iru-újú na ihere nke ịbụ nwaanyị àgà oge ndụ ya nile. Ịnụ na ọ ga-amụ nwa bụụrụ Meri nnukwu agbamume. Ọ bụghị naanị ya nọ n'ụwa a jupụtara n'ihe egwù nke mbịakwute, amụma, na mmezu gasị.
Ozugbo ozugbo Meri kwadoro gawa ịhụ onye ikwu ya. Ọ ga-aghọta ihe ya onwe ya na-agabiga. Mgbe Meri batara n’ọnụ ụzọ, nwa ahụ nọ n’ime Elizabet “maliri elu n'ime afọ ya.” Ọ bụghị naanị nke ahụ, Elizabeth jupụtara na Mmụọ Nsọ wee gọzie Meri na nwa ahụ o bù n'afọ ma jụọ ihe mere “nne nke (ya bụ Meri) Onye-nwe-m jiri bịakwute m (ya bụ Elizabet).” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mụ bụ Elizabet kwesịrị ịbịakwute gị bụ Meri.
Ihe nke ahụ meré abụghị ihe aga eji anya ọma leta, ma esi ụzọ omenala. Ọ bụ Meri bụ onye kwesịrị inye Elizabet nkwanye ùgwù, dịka okenye ya.
Mana Chineke na-ekwu na ọ bụghị ndị kachasị dị ogo na ọhaneze, ndị dị ike, ndị nwere ike nke obodo, ma ọ bụ ndị dị ọgaranya ka Ọ na-ele anya iji ha weta nzọpụta. Ọ bụrụ otú ahụ, ha ga-achọ inata otuto maka ọrụ ha. Mgbe niile ka Chineke n'eme ihe n'ụzọ ana-atụghị anya, Akwụkwọ Nsọ ewee n'ekwusi ike na ọ bụ naanị Chineke ga-anata otuto na nsọpụrụ—sọọsọ Ya ka o rurù. Ọ na-achọ ndị dị umeala n’obi, ndị o nweghị ihe eji ha wee kpọrọ, ndị ihe Ya n'atụ n'anya, ma ee, ụfọdụ n’ime ha bi n’obí eze.
Mgbe nke ahụ mere, Meri, site na mgbamume nke ọ natara na yabụ ekele, tiwapurù n'abụ, n'ekwupụta ihe Chineke meere ya. Abụ a dị ịrịba ama, nke n'echetara anyị maka ndị amụma, n'eme ememe nhọpụta nke Onye-nwe-anyị họpụtara Meri—nwanyị nke “si n'ebe ikpofu ahịhịa,”—na nchụsasị na nweda-ala emere ndị mpako. Abụ Meri jupụtara na ihe ntụaka Agba Ochie ma n'ada ka otu ndị amụma si ekwu okwu, nke mere ka anyị hụ n'ezie na n'agbanyeghị na Meri bụ nwa agbọghọ, ọ bụ onye n'agụ Okwu Chineke n'uju ma dị nghọta-ime gbasara Chineke na ụzọ Ya gasị O si arụ ọrụ.
Site n'ebe a, Meri nọnyeere onye ikwu ya ọnwa atọ, nke bụ uche m na ọ dabara n'oge ọmụmụ Jọn, Onye Na-eme Baptizịm. Leenụ ike na nkasi obi ha abụọ bụ nye ibe ya. Anyị nwere ike iji anya uche anyị, hụ ka ha abụọ na-akparịta ụka, ka ha n'ekpekọ ekpere ọnụ, ka ha na-agụkọta okwu ndị amụma, ikekwe ọbụna Aịsaịa, onye nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere Ohu nke Onye-nwe-anyị.
A n'enwe mgbe ọbụla onye n'aga n’ụzọ yiri nke anyị iji gbaa anyị ume ma wusie anyị ike na nrube isi anyị obere ma ọ bụ nnukwu nye okwu Chineke. Ọ bụ ha ka anyị kwesịrị ịgakwuru ngwa ngwa, dị ka Meri mere, iji nweta nkwado na obi ike.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.
More