Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntụgharị-Uche Gasị Nke EkeresimesiIhe Atụ

Christmas Reflections

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Meri Kwuru Ee

Gabriel ji ozi sitere n’aka Chineke bịakwute Meri—“Onye e meere amara nke ukwuu, Onye-nwe-anyị nọnyeere gị.” Meri ghọtara kpọmkwem ihe ekele a pụtara nke mere o jiri nyee ya nsogbu n'obi. Nke a bụ ihe Chineke gwara ndị-ikpé na ndị-amuma nke Agba Ochie—otu n'ime ndị a ọ dịghị nke Meri hụrụ onwe ya kà.

Gịnị ka nke a nwere ike ịpụta, bụ ihe ọ zara n'ụjọ? Ọ bụrụ na anyị etinye onwe anyị na ọnọdụ a, ọ ga-abụ na ụdị ihe a ga “enyekwa anyị nsogbu nke ukwuu. Eji m n'aka na ọ dịghị ka mpụta nke mmụọ-ozi gosi onye ọ bụla ga-eme ka onye ahụ ghara inye nzaghachi atụghị oké egwù. Ebube n'eso mpụta ndị mmụọ ozi bú okwu amụma bịakwute mmadụ abụghị ihe ga-eme ka anyị, "dị jụụ n'eme ka anyị n'eme."

E kwere Meri nkwa na ọ ga-amụ nwa, ihe n’onwe ya adịghị ahukebe, ma ọ bụ ihe ana-atụghị anya ya. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ ndị Juu lụrụ di ma mụọ ụmụ. Mana ọtụtụ, mee ya ha niile, ụmụ agbọghọ ndị Juu nwere onye ha na ha ga-amụ ụmụ—nke a bụkwa nke ha ka n'eme. Mana nwatakịrị a Meri ga-amụ abụghị nwa nkịtị, ọ bụ “Nwa nke Onye Kasị Elu,” nwa nke Eze Devid e kwere ná nkwa, onye gaje ịchị ruo mgbe ebighị ebi. Mana gịnị nọ n'akpaghari n'obi Meri ka ọ nụrụ nke a?

Ọ zara, sị, “Olee otú nke a ga-esi dị, ebe m bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.” Mmụọ ozi ahụ agwala Meri ihe ana-anụtụbeghị, nke na, elee ya anya ofuma (onyekwanú ga-ekwe ma ọ nụ akụkọ ya), na ajụjụ Meri abụghị site n'enweghị okwukwe ma ọ bụ adịghị ntụkwasị obi.

Mmụọ Nsọ ga-adakwasị ya, ma Okwu ebighi-ebi nke Nna Anyị Eluigwe ga-abụ anụ arụ n’ime afọ Meri.

Nzaghachi ya: “Lee, abụ m ohu Onye-nwe-anyị; ka ọ dịrị m dị ka okwu gị si dị.” Leenụ ụdị ntụkwasị obi, ụdị nrubeisi Meri gosipụtara. Na ezigbo ihe ga-efu ya ọ ga-eche ihu na nrubeisi ya nye Chineke.

Olee ebe nrubeisi anyị garuru? Inata okwu Chineke abụghị mgbe niile ka ọ ga-adaba ma ọ bụ dị nkwekọ na atụmatụ̀ anyị nwerè maka ihe ịga nke ọma nye ndụ anyị. Mana lee ihe mpụta magburu onwe ya n'eso ndị si ee nye Chineke, lee nrụkọ-ọrụ dị ịtụnanya nke ha na Chineke. Dị ka Meri anyị n'ebu mkpụrụ nke okwu mgbapụta nke Chineke mgbe “amabeghị m” anyị, ịkpụ ukwu anyị n'ala, na-agbanwe ghọọ ee nye Chineke.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas Reflections

Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Simon McIntyre maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.simonmcintyre.net/